Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Job 11:11-19 Bible Nso (IGBOB)

11. N'ihi na Ya onwe-ya mara madu efu:Ọ nāhu kwa ajọ ihe, mb͕e Ọ nādighi-elegide ya anya.

12. Ma nkpọkọrọ madu gēnwe obi,Mb͕e amuru nwa-inyinya-ibu-ọhia ka ọ buru madu.

13. Ọ buru na gi onwe-gi edozie obi-gi,We b͕asa ọbu-aka-gi abua n'ebe Ọ nọ;

14. Ọ buru na ajọ ihe adi n'aka-gi, me ka ọ di n'ebe di anya,Ekwe-kwa-la ka ajọ omume biri nulo-ikwū-gi nile;

15. N'ihi na mb͕e ahu i gēweli iru-gi nēnweghi ọlu n'aru-gi;I gābu kwa ihe siri ike dika ọla awuru awu, i gaghi-atu kwa egwu:

16. N'ihi na gi onwe-gi gēchezọ ọnọdu ọjọ gi,Dika miri nke gabigara agabiga ka i gēcheta ya:

17. Kari etiti-ehihie ka ubọchi ndu-gi gēbili kwa;Ọ buru na oké ọchichiri adi, ọ gādi ka ututu.

18. I gātukwasi kwa obi, n'ihi na olile-anya di;I gēnyocha kwa, were ntukwasi-obi dina.

19. Ọzọ kwa, i gāmakpu, ọ dighi kwa onye nēme ka i ma jijiji;Ọtutu madu gēme kwa ka iru-gi dajua.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Job 11