Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jeremaia 51:51-64 Bible Nso (IGBOB)

51. Ihere emewo ayi, n'ihi na ayi anuwo ita-uta; ọnọdu-ihere etiyere ayi nime ya ekpuchiwo ayi n'iru: n'ihi na ndi ala ọzọ abàwo imegide ebe nsọ nile nke ulo Jehova.

52. N'ihi nka, le, ubọchi nābia, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), mb͕e M'gēji nmehie-ha leta arusi-ya nile apiri api; ọ bu kwa n'ala-ya nile ka ndi emeruworo aru gāsu udè.

53. Asi na Babilon arigorue elu-igwe, asi kwa na o wusie ebe di elu nke ike-ya ike, ma na Mu ka ndi nāpunara ya ihe gēsi biarue ya aru; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.

54. Ge nti olu iti-nkpu sitere na Babilon, na olu ntipia uku sitere n'ala ndi Kaldea!

55. n'ihi na Jehova nāpunara Babilon ihe-ya, Ọ nēme kwa ka oké olu si nime ya la n'iyì; nmali-miri nile ha we bib͕ọ dika ọtutu miri, nkpọtu nke olu-ha akpọtuwo:

56. n'ihi na onye nāpunara ya ihe-ya ab͕iakwasiwo obodo ahu, bú Babilon, ejidewo kwa ndi-dike-ya, ab͕ajisiwo uta nile ha: n'ihi na Chineke nke nēmeso madu otú ha si eme ka Jehova bu, Ọ ghaghi ikwughachi.

57. M'gēme kwa ndi-isi-ya, na ndi-ya mara ihe, na ndi-ya nāchi ala, na ndi-ya nọchiri anya eze, na ndi-dike-ya, ka ha ṅubiga manya ókè; ha gāraru kwa ura ebighi-ebi, ghara iteta; ọ bu ihe si n'ọnu Eze ahu puta, Jehova nke usu nile nke ndi-agha bu aha-Ya.

58. Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri: Mb͕idi nile nke Babilon nke sara mbara, agēme ka ha ghọ ebe dasiri adasi, ọzọ, ọnu-uzọ-ama-ya nile nke di elu, agēji ọku sure ha; ndi nile di iche iche gādọb͕u kwa onwe-ha n'ọlu n'efu, mba di iche iche gādọb͕u onwe-ha n'ọlu itiye n'ọku: ike ewe gwu ha.

59. Okwu ahu nke Jeremaia, bú onye-amuma, nyere Seraia nwa Neraia, nwa Mahseia, n'iwu, mb͕e o soro Zedekaia, bú eze Juda, je Babilon n'arọ nke-anọ nke ọbubu-eze-ya. Ma Seraia bu onye-isi idozi ebe-izu-ike nke eze.

60. Jeremaia we de ihe ọjọ ahu nile nke gābiaru Babilon aru n'otù akwukwọ, bú okwu ndia nile nke edeworo bayere Babilon.

61. Jeremaia we si Seraia, Mb͕e i bàra na Babilon, gi le anya ka i gua okwu ndia nile,

62. si, Jehova, Gi onwe-gi ekwuwo okwu bayere ebe a ibipu ya, ka ihe ọ bula we ghara ibi nime ya, ma ọ bu madu ma-ọbu anumanu, n'ihi na ebe tọb͕ọrọ n'efu mb͕e ebighi-ebi ka ọ gābu.

63. Ọ gēru kwa, mb͕e i gubisiri akwukwọ a, na i gēkegide ya nkume, tubà ya n'etiti Yufretis:

64. i gāsi kwa, Otú a ka Babilon gēmikpu, ghara ibili ọzọ n'ihi ihe ọjọ ahu nke Mu onwem gaje ime ka ọ biakwasi ya: ike ewe gwu ha.Rue ebe a bu okwu Jeremaia.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Jeremaia 51