Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jeremaia 51:35-44 Bible Nso (IGBOB)

35. Ihe-ikem na nke anu-arum di n'isi Babilon, ka nwanyi nke bi na Zaion gāsi; ọzọ, Ọbaram di n'isi ndi bi na Kaldea, ka Jerusalem gāsi.

36. N'ihi nka ka Jehova ji si otú a: Le, M'gaje ikpe ọnu-gi, bọ̀ ọ́bọ̀-gi; M'gēme kwa ka oké osimiri-ya tasia, me kwa ka isi-iyi-ya takọrọ.

37. Babilon gāghọ kwa nání obo-ihe obo-ihe, ebe-obibi nkita-ọhia, na ihe-iju-anya, na ihe-ima-ọsọ, ghara inwe onye-obibi.

38. N'otù ka ha gāb͕ọ uja dika umu-ọdum; ha edekpọwo dika umu-ọdum nāṅu ara.

39. N'okpom-ọku-ha ka M'gēme ọṅuṅu-manya nile ha, mee ka ha ṅubiga manya ókè, ka ha we ṅuria ọṅu-agha, raru ura ebighi-ebi, ghara iteta; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.

40. M'gēme ka ha rida dika umu-aturu ka ewe b͕ue ha, dika ebulu, ha na nkpi.

41. Le, ka esiworo were Shishak! le, ka esiworo jide otuto uwa nile! le, ka Babilon siworo ghọ ihe-iju-anya n'etiti mba nile!

42. Oké osimiri erukpuwo Babilon: ejiwo nkpọtu nmali-miri-ya nile kpuchie ya.

43. Obodo-ya nile aghọwo ihe-iju-anya, na ala kpọrọ nku, na ala ihe nādighi, bú ala nke ọ nādighi onye ọ bula nēbi nime ha, nwa madu ọ bula adighi-agabiga kwa nime ha.

44. M'gēji kwa nmehie-ya leta Bel nime Babilon, M'gēme kwa ka ihe o loworo si n'ọnu-ya puta; mba di iche iche agaghi-erùkuru kwa ya ọzọ dika miri: ọzọ mb͕idi Babilon gāda.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Jeremaia 51