Obodo-ya nile aghọwo ihe-iju-anya, na ala kpọrọ nku, na ala ihe nādighi, bú ala nke ọ nādighi onye ọ bula nēbi nime ha, nwa madu ọ bula adighi-agabiga kwa nime ha.