Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jeremaia 49:32-37 Bible Nso (IGBOB)

32. Camel nile ha gāghọ kwa ihe-nluta-n'agha, ìgwè anumanu-ha gāghọ kwa ihe-nkwata: M'gēfesa-kwa-ra ifufe nile ndi akọpuworo usọ isi-ha; ọ bu kwa n'ofè-ya nile ka M'gēme ka nhuju-anya-ha si bia; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.

33. Hezoa gāghọ kwa ebe-obibi nkita-ọhia, bú ebe tọb͕ọrọ n'efu rue mb͕e ebighi-ebi: ọ dighi onye ọ bula gēbi n'ebe ahu, nwa madu ọ bula agaghi-anọ kwa dika ọbìa nime ya.

34. Okwu Jehova nke ruru Jeremaia, bú onye-amuma, nti bayere Ilam na mb͕e mbu nke ọbubu-eze nke Zedekaia, bú eze Juda, si,

35. Otú a ka Jehova nke usu nile ndi-agha siri: Le, M'gaje ib͕aji uta Ilam, bú isi ihe nke idi-ike-ha.

36. M'gēme kwa ka ifufe anọ si na nsọtu anọ nke elu-igwe biakute Ilam, M'gēfesa kwa ha nye ifufe nile ndia; ọ gaghi-adi kwa mba ọ bula ebe ndi Ilam achugara achuga nāgaghi-abà.

37. M'gēme kwa ka Ilam tua ujọ n'iru ndi-iro-ha na n'iru ndi nāchọ ndu-ha: M'gēme kwa ka ihe ọjọ biakwasi ha, bú iwe di ọku nkem, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta); M'gēziga kwa mma-agha n'azu ha, rue mb͕e M'mere ka ha gwusia:

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Jeremaia 49