Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jeremaia 48:28-44 Bible Nso (IGBOB)

28. Rapunu obodo nile, we biri na nkume di elu, unu ndi bi na Moab; di-kwa-nu ka nduru nke nālu akwu-ya n'ofè ọnu olùlù.

29. Ayi anuwo ihe bayere npako Moab, na ọ nāpako npako nke-uku; ọbuná ihe bayere idi-elu-ya, na npako-ya, na nganga-ya, na nbuli-elu nke obi-ya.

30. Mu onwem mara nrubiga-ókè-iwe-ya, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), na ihe nēzighi ezi ka ọ bu; ekwukwu-ya nile, ihe nēzighi ezi ka ha meworo.

31. N'ihi nka ka m'gākwasiri Moab ákwá ike; e, ọ bu Moab nile ka m'gētiri nkpu: bayere ndi Kia-heres ka agātamu ntamu.

32. Ákwá nke kariri ákwá Jeza ka m'gākwara gi, gi osisi vine nke Sibma: alaka-gi nile gabigara oké osimiri, ọbuná n'oké osimiri nke Jeza ka ha ruru: n'elu nghọkọta-nkpuru-gi na n'elu nghọrọ-nkpuru-vine-gi ka onye nke nāpunara madu ihe daworo.

33. Ewepuwo kwa ọṅù na iteghari-egwú-ọṅù n'ubi ọma na n'ala Moab; emewokwam ka manya-vine kwusi n'ebe-nzọcha-nkpuru-vine nile: ọ dighi onye gēji iti-nkpu nzọcha-nkpuru-vine zọcha nkpuru-vine; iti-nkpu nzọcha-nkpuru-vine agaghi-abu iti-nkpu nzọcha-nkpuru-vine.

34. Site n'iti-nkpu Heshbon rue Eleale, rue Jehez ka ha mere ka olu-ha da, site na Zoa rue Horonaim, rue Eglat-shelishiya: n'ihi na ọbuná miri Nimrim gāghọ nání ebe tọb͕ọrọ n'efu.

35. M'gēme kwa ka ọ kwusiri Moab, bú onye nēsure àjà-nsure-ọku n'ebe di elu, na onye nēsurere chi di iche ya ihe-nsure-ọku nesì ísì utọ; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.

36. N'ihi nka obim nādara Moab udà dika ọ̀jà, obim nāda-kwa-ra ndi Kia-heres udà dika ọ̀jà: n'ihi nka ihe o nwebigara ókè nke o nwetara alawo n'iyì.

37. N'ihi na isi nile ọ bula kwọchara akwọcha, ọ bu kwa afu-ọnu nile ọ bula ka ebipuworo: n'aka nile ka obibì-mma dikwasi, n'úkwù nile ka ákwà-nkpe di kwa.

38. N'elu-ulo nile nke Moab na n'amá-ya nile, n'ebe nile ọ bula, ka iti-aka-n'obi di: n'ihi na etiwawom Moab dika ihe nātọghi utọ; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.

39. Le ka esi tipia ya nke-uku! ha akwasiwo ákwá ike. Le ka Moab si b͕akuta azu n'ihere nke-uku! Moab aghọwo-kwa-ra ndi nile di ya buruburu ihe-ọchì na ihe-itu-ujọ.

40. N'ihi na otú a ka Jehova siri: Le, dika ugo ka ọ gēfesi ike, b͕asa nkù-ya abua rue Moab.

41. Ewerewo Keriot, anarawo kwa ebe nile ewusiri ike, obi ndi-dike Moab n'ubọchi ahu gādi kwa ka obi nwanyi ime nēme.

42. Agēkpochapu kwa Moab ka ọ ghara ibu otù ndi, n'ihi na ọ bu imegide Jehova ka ọ meworo onwe-ya ka ọ di uku.

43. Oké egwu na olùlù na ib͕udu nādikwasi gi, gi onye bi na Moab; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.

44. Onye ahu nke nāb͕apu n'iru oké egwu ahu gādabà n'olùlù ahu; ọzọ, onye ahu nke nārigoputa n'òlùlù ahu, agējide ya n'ib͕udu ahu: n'ihi na M'gēme ka arọ nleta-ha biakute ya, bú Moab; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Jeremaia 48