Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jeremaia 46:2-18 Bible Nso (IGBOB)

2. Nke diri Ijipt: bayere usu-ndi-agha nke Fero-neko, bú eze Ijipt, nke di n'akuku osimiri Yufretis nime Kakemish, nke Nebukadreza, bú eze Babilon, tib͕uru n'arọ nke-anọ nke Jehoiakim nwa Josaia, bú eze Juda.

3. Donu ọta na ọta uku n'usoro, biaru-kwa-nu nso ibu agha.

4. Kegidenu inyinya n'ub͕ọ-ala, rikwasinu, unu ndi-inyinya, guzo-kwa-nu onwe-unu nēkpu okpu-agha; richanu ube-unu, yirinu uwe-agha-unu.

5. Gini mere m'huworo ya? ndi ahu nātu ujọ b͕aghachi azu; anētipia kwa ndi-dike-ya, ha ab͕alagawo kwa ngwa ngwa, we ghara ile anya n'azu: egwu di buruburu; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.

6. Ka onye nwere ukwu ọsọ ghara ib͕alaga, ka dike ghara kwa iwepuga onwe-ya; n'Ugwu n'akuku osimiri Yufretis ka ha suru ngọngọ, da.

7. Ònye bu onye a? dika osimiri Nail ka ọ nērú, dika osimiri ka miri-ya nile nāmaghari.

8. Ijipt nērú dika osimiri Nail, ọ bu kwa dika osimiri ka miri-ya n'amaghari: o we si, M'gārigo, kpuchie uwa; m'gēme ka obodo na ndi bi nime ya la n'iyì.

9. Rigonu, unu inyinya; kpọtuanu nkpọtu, unu ub͕ọ-ala; ka ndi-dike puta kwa: Kush na Put, ndi nēji ọta; na Ludim, ndi nēji nāzọ kwa uta ukwu ikwe ya.

10. Ma ubọchi ahu diri Onye-nwe-ayi, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, ọ bu ubọchi ibọ̀-ọ́bọ̀, ka O we bọ̀rọ Onwe-ya ndi nēmegide Ya ọ́bọ̀: mma-agha gēripia kwa, afọ eju kwa ya, ọ gāṅuju kwa ọbara-ha afọ: n'ihi na àjà ka Onye-nwe-ayi, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, nwere n'ala Ugwu n'akuku osimiri Yufretis.

11. Rigorue Gilead, nara balm, gi nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke, bú ada Ijipt: n'efu ka i meworo ka ọgwu ba uba; ọ dighi ọgwu-ntechi i nwere.

12. Mba nile anuwo ihere-gi, iti-nkpu-gi juputa-kwa-ra uwa: n'ihi na dike asukwasiwo dike ngọngọ, n'otù ka ha dakọworo, ha abua.

13. Okwu ahu nke Jehova gwara Jeremaia, bú onye-amuma, bayere ọbibia nke Nebukadreza, bú eze Babilon, itib͕u ala Ijipt.

14. Gosinu n'Ijipt, menu ka anuru ya na Migdol, me-kwa-nu ka anuru nime Nof na nime Tahpanhes: sinu, Guzo onwe-gi, dozi-kwa-ra onwe-gi; n'ihi na mma-agha eripiawo buruburu gi.

15. Gini mere eji zachapu onye nke gi di ebube? o guzoghi, n'ihi na Jehova kwaturu ya.

16. O mere ka ndi nāsu ngọngọ di ọtutu, e, otù onye dakwasiri ibe-ya: ha we si, Bilie, ka ayi laghachikuru ndi-ayi, laghachi kwa n'ala amuru ayi, pua n'iru mma-agha nēme ihe-ike.

17. Ha kpọrọ nkpu n'ebe ahu, si, Fero, bú eze Ijipt, bu nání nkpọtu; o kwerewo ka mb͕e akara àkà gabiga.

18. Mu onwem nādi ndu, (ọ bu ihe si n'ọnu Eze ahu puta, Jehova nke usu nile nke ndi-agha bu aha-Ya), n'ezie dika Teboa n'etiti ugwu nile, na dika Kamel n'akuku oké osimiri, otú a ka ọ gābia.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Jeremaia 46