Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jeremaia 38:1-16 Bible Nso (IGBOB)

1. Shefataia nwa Matan, na Gedalaia nwa Pashua, na Jukal nwa Shelemaia, na Pashua nwa Malkija, we nuru okwu nile nke Jeremaia nāgwa ndi Israel nile, si,

2. Otú a ka Jehova siri, Onye nānọgide n'obodo a gānwu site na mma-agha, na site n'oké unwu, na site n'ajọ ọria nēfe efe: ma onye nāpukuru ndi Kaldea gādi ndu, ndu-ya ewe ghọrọ ya ihe-nkwata, o we di ndu.

3. Otú a ka Jehova siri, Aghaghi inye obodo a n'aka usu-ndi-agha nke eze Babilon, ọ gēwere kwa ya.

4. Ndi-isi we si eze, Biko, ka eme ka nwoke a nwua; n'ihi na ya onwe-ya nēme ka aka ndi-agha kuda, bú ndi fọduru n'obodo a, na aka ndi Israel nile, n'igwa ha okwu dika okwu ndia: n'ihi na nwoke a adighi-achọrọ ndi nka udo, kama ọ bu ihe ọjọ.

5. Eze, bú Zedekaia, we si, Le, onye ahu di n'aka-unu: n'ihi na eze abughi onye puru ime ihe ọ bula megide unu.

6. Ha we were Jeremaia, tubà ya n'olùlù Malkija nwa eze, nke di n'ogige ulo-nche: ha we chiri udọ̀ rada Jeremaia. Ma miri adighi n'olùlù ahu, ọ bu nání apiti: Jeremaia we mibe n'apiti ahu.

7. Ebed-melek, bú onye Etiopia, onye bu onozi, nke nọ n'ulo eze, we nuru na ha tiyereri Jeremaia n'olùlù; ma eze nānọdu n'ọnu-uzọ-ama Benjamin;

8. Ebed-melek we si n'ulo eze puta, gwa eze okwu, si,

9. Onye-nwem eze, ndikom ndia emewo ihe ọjọ n'ihe nile nke ha meworo Jeremaia, bú onye-amuma, onye ha tubàworo n'olùlù ahu; o we nọ n'ọnwu n'ọnọdu-ya n'ihi oké unwu: n'ihi na nri adighi kwa ọzọ n'obodo a.

10. Eze we nye Ebed-melek, bú onye Etiopia, iwu, si, Si n'ebe a chiri orú ndikom na iri n'aka-gi, me ka Jeremaia, bú onye-amuma, si n'olùlù ahu rigoputa, tutu ọ nwua.

11. Ebed-melek we chiri ndikom ahu n'aka-ya, ba n'ulo eze n'okpuru ulo-àkù, chiputa n'ebe ahu nkirika ákwà nke dọkara adọka na nkirika ákwà nke kara nká, o we chiri udọ̀ radara ha Jeremaia n'olùlù ahu.

12. Ebed-melek, bú onye Etiopia, we si Jeremaia, Biko, tiye nkirika ákwà ndia nke dọkara adọka na nke kara nká n'okpuru nkpa-abu-gi abua n'okpuru udọ̀. Jeremaia we me otú a.

13. Ha we chiri udọ̀ ahu dọgota Jeremaia, we me ka o si n'olùlù ahu rigoputa: Jeremaia we nọgide n'ogige ulo-nche ahu.

14. Eze, bú Zedekaia, we ziga, kutara onwe-ya Jeremaia, bú onye-amuma, rue nbata nke-atọ nke di n'ulo Jehova: eze we si Jeremaia, Mu onwem gaje iju gi otù ihe; ezonarilam ihe ọ bula.

15. Jeremaia we si Zedekaia, Mb͕e m'gēgosi gi, ì gaghi-eme ka m'nwua n'ezie? ọzọ, mb͕e m'gādu gi ọdu, i gaghi-egem nti.

16. Eze, bú Zedekaia, we ṅuara Jeremaia iyi na nzuzo, si, Jehova nādi ndu, bú Onye ahu nke nyere ayi ndu a, m'gaghi-eme ka i nwua ma-ọli, m'gaghi-enye kwa gi ma-ọli n'aka ndikom ndia ndi nāchọ ndu-gi.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Jeremaia 38