Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jeremaia 37:13-21 Bible Nso (IGBOB)

13. O rue, mb͕e ọ nọ n'ọnu-uzọ-ama Benjamin, na otù onye-nwe nlekọta nọ n'ebe ahu, onye aha-ya bu Iraija nwa Shelemaia, nwa Hananaia; o we jide Jeremaia, bú onye-amuma, si, Ndi Kaldea ka gi onwe-gi nādakuru.

14. Jeremaia we si, Ọ bu okwu-ugha; adighm-adakuru ndi Kaldea; ma o geghi ya nti: Iraija we jide Jeremaia, me ka ọ biakute ndi-isi.

15. Ndi-isi we wesa Jeremaia iwe, tie ya ihe, tiye ya n'ulo-nkpọrọ, bú ulo Jonatan ode-akwukwọ; n'ihi na ulo ahu ka ha mereri ulo-nkpọrọ.

16. Mb͕e Jeremaia batara n'ulo olùlù, na n'ime-ulo ntà ya, Jeremaia we nọdu n'ebe ahu ọtutu ubọchi;

17. eze, bú Zedekaia, we ziga, kuta ya: eze we jua ya n'ulo-ya na nzuzo, si, Ọ̀ di okwu ọ bula sitere na Jehova? Jeremaia we si, Okwu di. O we si, N'aka eze Babilon ka agēnye gi.

18. Jeremaia we si eze, bú Zedekaia, Gini ka m'mehieworo megide gi, ma-ọbu megide ndi-orù-gi, ma-ọbu megide ndi nka, na unu tiyeworo mu onwem n'ulo-nkpọrọ?

19. Òle ebe kwa ka ndi-amuma-unu nọ, bú ndi buru unu amuma, si, Eze Babilon agaghi-abia imegide unu, ma-ọbu imegide ala nka?

20. Ma ub͕u a, biko, nuru, onye-nwem, eze: biko, ka aririọ-amaram da n'iru gi; eme-kwa-la ka m'laghachi n'ulo Jonatan, bú ode-akwukwọ, ka m'we ghara inwu n'ebe ahu.

21. Eze, bú Zedekaia, we nye iwu, ha we tiye Jeremaia n'ogige ulo-nche, nēnye ya otù ob͕e achicha kwa-ubọchi site n'èzí ndi-osi-ite, rue mb͕e achicha nile nke di n'obodo gwusiri. Jeremaia we nọgide n'ulo-nche.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Jeremaia 37