Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jeremaia 36:5-17 Bible Nso (IGBOB)

5. Jeremaia we nye Beruk iwu, si, Mu onwem bu onye eb͕ochibidoworo; apughm ibà n'ulo Jehova:

6. ma gi onwe-gi je, gua n'akwukwọ-npiakọta ahu, nke i deworo site n'ọnum, okwu nile nke Jehova na nti ndi Israel, n'ulo Jehova n'ubọchi obubu-ọnu: ọ bu kwa na nti Juda nile ndi si n'obodo nile ha abia ka i gāgu ha.

7. Eleghi anya aririọ-amara-ha gāda n'iru Jehova, ha ewe lata, onye ọ bula o si n'uzọ ọjọ ya lata: n'ihi na ọ di uku, bú iwe ahu na ọnuma ahu nke Jehova kwuworo megide ndi nka.

8. Beruk nwa Neraia we me dika ihe nile si di nke Jeremaia, bú onye-amuma, nyere ya n'iwu, o we gua n'akwukwọ ahu okwu nile nke Jehova n'ulo Jehova.

9. O rue, n'arọ nke-ise nke Jehoiakim nwa Josaia, bú eze Juda, n'ọnwa nke-iteghete, na ndi nile ndi nọ na Jerusalem, na ndi nile ndi si n'obodo nile nke Juda abata na Jerusalem, kpọsara obubu-ọnu n'iru Jehova.

10. Beruk we gua n'akwukwọ ahu okwu nile nke Jeremaia n'ulo Jehova, n'ime-ulo Gemaraia nwa Shefan, bú ode-akwukwọ, n'ogige nke di n'elu, n'oghere ọnu-uzọ-ama ọhu nke ulo Jehova, na nti ndi Israel nile.

11. Maikaia nwa Gemaraia, nwa Shefan, we nuru okwu nile nke Jehova nke sitere n'akwukwọ ahu,

12. o we rida n'ulo eze, rue ime-ulo nke ode-akwukwọ: ma, le, n'ebe ahu ka ndi-isi nile nānọdu, bú Elishama ode-akwukwọ, na Delaia nwa Shemaia, na Elnetan nwa Akboa, na Gemaraia nwa Shefan, na Zedekaia nwa Hananaia, na ndi-isi nile.

13. Maikaia we gosi ha okwu nile ọ nuru, mb͕e Beruk nāgu akwukwọ ahu na nti ndi Israel nile.

14. Ndi-isi nile we zìe Jehudi nwa Netanaia, nwa Shelemaia, nwa Kushi, jekuru Beruk, si, Akwukwọ-npiakọta ahu nke iguworo ihe nime ya na nti ndi Israel, were n'aka-gi bia. Beruk nwa Neraia we were akwukwọ-npiakọta ahu n'aka-ya, biakute ha.

15. Ha we si ya, Biko, nọdu ala, gua ya na nti-ayi. Beruk we gua ya na nti-ha.

16. O rue, mb͕e ha nusiri okwu ndia nile, na ha turu oké egwu, onye na ibe-ya, ha we si Beruk, Ayi aghaghi igosi eze okwu ndia nile.

17. Ha we jua Beruk, si, Biko, gosi ayi, Ì siri aṅa deputa okwu ndia nile n'ọnu-ya?

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Jeremaia 36