Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jeremaia 36:15-31 Bible Nso (IGBOB)

15. Ha we si ya, Biko, nọdu ala, gua ya na nti-ayi. Beruk we gua ya na nti-ha.

16. O rue, mb͕e ha nusiri okwu ndia nile, na ha turu oké egwu, onye na ibe-ya, ha we si Beruk, Ayi aghaghi igosi eze okwu ndia nile.

17. Ha we jua Beruk, si, Biko, gosi ayi, Ì siri aṅa deputa okwu ndia nile n'ọnu-ya?

18. Beruk we si ha, N'ọnu-ya ka ọ nākpọrọm okwu ndia nile, ma mu onwem were ink ede ha n'akwukwọ a.

19. Ndi-isi we si Beruk, Je, zobe onwe-gi, gi onwe-gi na Jeremaia; ekwe-kwa-la onye ọ bula mara ebe unu onwe-unu nọ.

20. Ha we bakuru eze n'ogige; ma ha debereri akwukwọ-npiakọta ahu n'ime-ulo Elishama, bú ode-akwukwọ; ha we gosi okwu nile na nti abua nke eze.

21. Eze we ziga Jehudi iweta akwukwọ-npiakọta ahu: o we weputa ya n'ime-ulo Elishama, bú ode-akwukwọ. Jehudi we gua ya na nti abua nke eze, na na nti ndi-isi nile ndi nēguzo n'akuku eze.

22. Ma eze nānọdu n'ulo mb͕e oyi n'ọnwa nke-iteghete: ọku nēnwu kwa n'ite-ọku nke di n'iru ya.

23. O rue, mb͕e Jehudi gusiri ibe akwukwọ atọ ma-ọbu anọ, na o ji mma ode-akwukwọ bìkasia ya, tubà ya n'ọku nke di n'ite-ọku, rue mb͕e akwukwọ-npiakọta ahu resiri n'ọku nke di n'ite-ọku.

24. Ma ha atughi oké egwu, ha adọwaghi kwa uwe-ha, bú eze na ndi-orù-ya nile ndi nānu okwu ndia nile.

25. Ọzọ kwa, Elnetan na Delaia na Gemaraia riọrọri eze arìriọ ka ọ ghara isure akwukwọ-npiakọta ahu: ma o geghi ha nti.

26. Eze we nye Jeramil nwa eze na Seraia nwa Azriel na Shelemaia nwa Abdeel iwu iwere Beruk, bú ode-akwukwọ, Jeremaia, bú onye-amuma: ma Jehova zobere ha.

27. Okwu Jehova we rue Jeremaia nti, mb͕e eze suresiri akwukwọ-npiakọta ahu, na okwu nile nke Beruk deputara n'ọnu Jeremaia, si,

28. Were kwa n'onwe-gi akwukwọ-npiakọta ọzọ, dekwasi na ya okwu mbu nile nke di n'elu akwukwọ-npiakọta mbu, nke Jehoiakim, bú eze Juda, sureworo ọku.

29. Ma i gēkwu okwu bayere Jehoiakim, bú eze Juda, si, Otú a ka Jehova siri: Gi onwe-gi esurewo akwukwọ-npiakọta nka ọku, si, Gini mere i ji dekwasi n'akwukwọ a, si, Eze Babilon aghaghi ibia bibie ala nka, me ka madu na anumanu kwusi nime ya?

30. N'ihi nka ka Jehova ji kwue okwu di otú a bayere Jehoiakim, bú eze Juda, si: Ọ gaghi-enwe onye ganānọkwasi n'oche-eze Devid: ọzọ, ozu-ya gābu ihe etufuworo nye ọkpukpọ-nku n'ehihie, nye kwa ọtutu-oyi n'abali.

31. M'gēji kwa ajọ omume-ha leta ya, leta kwa nkpuru-ya, leta kwa ndi-orù-ya; M'gēme kwa ka ihe ọjọ ahu nile nke M'gwara ha, ma ha anughi, biakwasi ha, biakwasi kwa ndi bi na Jerusalem, biakwasi kwa ndi Juda.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Jeremaia 36