Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jeremaia 36:11-15 Bible Nso (IGBOB)

11. Maikaia nwa Gemaraia, nwa Shefan, we nuru okwu nile nke Jehova nke sitere n'akwukwọ ahu,

12. o we rida n'ulo eze, rue ime-ulo nke ode-akwukwọ: ma, le, n'ebe ahu ka ndi-isi nile nānọdu, bú Elishama ode-akwukwọ, na Delaia nwa Shemaia, na Elnetan nwa Akboa, na Gemaraia nwa Shefan, na Zedekaia nwa Hananaia, na ndi-isi nile.

13. Maikaia we gosi ha okwu nile ọ nuru, mb͕e Beruk nāgu akwukwọ ahu na nti ndi Israel nile.

14. Ndi-isi nile we zìe Jehudi nwa Netanaia, nwa Shelemaia, nwa Kushi, jekuru Beruk, si, Akwukwọ-npiakọta ahu nke iguworo ihe nime ya na nti ndi Israel, were n'aka-gi bia. Beruk nwa Neraia we were akwukwọ-npiakọta ahu n'aka-ya, biakute ha.

15. Ha we si ya, Biko, nọdu ala, gua ya na nti-ayi. Beruk we gua ya na nti-ha.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Jeremaia 36