Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jeremaia 34:1-10 Bible Nso (IGBOB)

1. Okwu ahu nke ruru Jeremaia nti site na Jehova, mb͕e Nebukadneza, bú eze Babilon, na usu-ndi-agha-ya nile, na ala-eze nile nke uwa nke aka-ya nāchi, na ndi nile di iche iche, nēbuso Jerusalem, nēbuso kwa obodo-ya nile, agha, si:

2. Otú a ka Jehova, bú Chineke nke Israel, siri, Je, gwa Zedekaia, bú eze Juda, okwu, si ya, Otú a ka Jehova siri, Le, M'gaje inye obodo a n'aka eze Babilon, ọ gēsure kwa ya n'ọku:

3. ma gi onwe-gi aghaghi-iwepuga onwe-gi n'aka-ya, kama aghaghi iwere gi, ọ bu kwa n'aka-ya ka agēnye gi; anya-gi abua gāhu kwa anya abua nke eze Babilon, unu gēkwurita kwa ọnu na ọnu, ọ bu kwa Babilon ka i gābà.

4. Ma otú ọ di, nuru okwu Jehova, gi Zedekaia, bú eze Juda: okwu di otú a ka Jehova kwuru bayere gi, si, I gaghi-anwu site na mma-agha:

5. n'udo ka i gānwu; ọzọ, nsure nile nke nna-gi-hà, bú ndi-eze mbu, ndi buru gi uzọ, otú a ka ha gēsurere gi ihe; ọzọ, Éwù, onye-nwe-ayi! ka ha gāsi n'itiri gi aka n'obi; n'ihi na okwu ka Mu onwem kwuworo; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.

6. Jeremaia, bú onye-amuma, we gwa Zedekaia, bú eze Juda, okwu ndia nile nime Jerusalem,

7. mb͕e usu-ndi-agha nke eze Babilon nēbuso Jerusalem, nēbuso kwa obodo Juda nile fọduru, agha, bú Lekish na Azeka; n'ihi na nání ndia fọduru nime obodo nile nke Juda, bú obodo ewusiri ike.

8. Okwu ahu nke ruru Jeremaia nti site na Jehova, mb͕e Zedekaia, bú eze, na ndi Israel nile ndi nọ Jerusalem, b͕asiri ndu, ikpọsara ha si na ha nwere onwe-ha;

9. na ha nile gēzilaga, onye ọ bula orù-ya nwoke, na onye ọ bula nwanyi nējere ya ozi, nke bu nwoke Hibru ma-ọbu nwanyi Hibru, inwere onwe-ya; ka madu we ghara ime ka ha fè ya òfùfè-orù, onye ọ bula o me ka onye-Ju, bú nwa-nne-ya, fè ya:

10. ndi-isi nile na ndi Israel nile we nuru, bú ndi bàra n'ọb͕ub͕a-ndu ahu, izilaga, onye ọ bula orù-ya nwoke, na onye ọ bula nwanyi nējere ya ozi, inwere onwe-ha, ka madu ọ bula we ghara ime kwa ka ha fè ya òfùfè-orù ọzọ; ha we nuru, zilaga ha:

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Jeremaia 34