Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jeremaia 32:8-16 Bible Nso (IGBOB)

8. Hanamel nwa nwa-nne nnam we biakutem, dika okwu Jehova si di, rue ogige ulo-nche, sim, Biko, zuru ubim nke di n'Anatot, nke di n'ala Benjamin: n'ihi na gi ka nnweta-ya ruru, ọ bu kwa gi nwe nb͕aputa-ya; zutara onwe-gi. M'we mara na okwu Jehova ka nka bu.

9. M'we zuru ubi ahu n'aka Hanamel nwa nwa-nne nnam, bú nke di n'Anatot, m'we tùara ya ego-ya, bú shekel iri na asa nke ọla-ọcha.

10. M'we de aham n'akwukwọ ala ahu, ka ya akàrà, kpọ ndi-àmà, tùara ya ego ahu n'ihe-ọtùtù.

11. M'we were akwukwọ nzuta-ala ahu, ma nke akara akàrà, nke ihe-ya enyere n'iwu na ukpuru-ya nile di nime ya, ma nke ghere oghe:

12. m'we were akwukwọ nzuta-ala ahu nye Beruk nwa Neraia, nwa Mahseia, n'anya Hanamel nwa nwa-nne nnam, na n'anya ndi-àmà ndi deworo aha-ha n'akwukwọ nzuta-ala ahu, n'anya ndi-Ju nile ndi nānọdu ala n'ogige ulo-nche ahu.

13. M'we nye Beruk iwu n'anya ha, si,

14. Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri: Chiri akwukwọ ndia, bú akwukwọ nzuta-ala nka, ma nke akara akàrà, ma akwukwọ a nke ghere oghe, tiye ha n'ite urọ; ka ha we digide ọtutu ubọchi.

15. N'ihi na otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri: Agāzu kwa ulo na ubi na ubi-vine ọzọ n'ala nka.

16. M'we kpere Jehova ekpere, mb͕e m'nyesiri Beruk nwa Neraia akwukwọ nzuta-ala, ahu, si,

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Jeremaia 32