Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jeremaia 32:14-20 Bible Nso (IGBOB)

14. Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri: Chiri akwukwọ ndia, bú akwukwọ nzuta-ala nka, ma nke akara akàrà, ma akwukwọ a nke ghere oghe, tiye ha n'ite urọ; ka ha we digide ọtutu ubọchi.

15. N'ihi na otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri: Agāzu kwa ulo na ubi na ubi-vine ọzọ n'ala nka.

16. M'we kpere Jehova ekpere, mb͕e m'nyesiri Beruk nwa Neraia akwukwọ nzuta-ala, ahu, si,

17. Ewo, Onye-nwe-ayi Jehova! le, Gi onwe-gi emewo elu-igwe na uwa site n'ike uku Gi na site n'ogwe-aka-Gi eseteri eseti: ọ dighi ihe ọ bula kariri Gi ime:

18. Gi onye nēmere nnù abua na ọgu iri nnù abua na ọgu iri ọtutu ub͕ò ebere, Onye nākwughachi ajọ omume nke ndi bu nna n'obi umu-ha gēsota ha n'azu: Chineke uku, nke bu dike, Jehova nke usu nile nke ndi-agha bu aha-Ya:

19. I di uku na ndum-ọdu, di kwa ike n'omume: Onye anya-Gi ghere oghe ilekwasi uzọ nile nke umu madu; inye onye ọ bula dika uzọ-ya nile si di, na dika nkpuru omume-ya nile si di:

20. Onye doro ihe-iriba-ama di iche iche na ihe-ebube di iche iche n'ala Ijipt, rue ta, ma n'etiti Israel ma n'etiti madu ọzọ; I we mere Onwe-gi aha, dika ta;

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Jeremaia 32