Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jeremaia 27:11-22 Bible Nso (IGBOB)

11. Ma mba ahu nke gēme ka olu-ya ba na yoke nke eze Babilon, nke gēfe kwa ya, M'gēkwe kwa ka mba ahu nọdu n'elu ala-ya, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta); ha gālu kwa ya, biri kwa nime ya.

12. Ọ bu kwa Zedekaia, bú eze Juda, ka m'gwara okwu dika okwu nile ndia si di, si, Menu ka olu-unu ba na yoke nke eze Babilon, fè-kwa-nu ya na ndi-ya, we di ndu.

13. N'ìhi gini ka unu gānwu, gi onwe-gi na ndi-gi, site na mma-agha, na site n'oké unwu, na site n'ajọ ọria nēfe efe, dika Jehova kwuworo bayere mba ahu nke nāgaghi-efe eze Babilon?

14. Ma unu egela nti okwu nile nke ndi-amuma ndi nāgwa unu okwu, si, Unu agaghi-efé eze Babilon: n'ihi na amuma ugha ka ha nēburu unu.

15. N'ihi na eziteghm ha, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), ma ha onwe-ha nēbu amuma ugha n'aham; ka M'we chupu unu, unu ewe la n'iyì, unu onwe-unu na ndi-amuma ndi nēburu unu amuma.

16. Ọ bu kwa ndi-nchu-àjà na ndi nka nile ka m'gwara okwu, si, Otú a ka Jehova siri: Unu egela nti okwu nile nke ndi-amuma-unu ndi nēburu unu amuma, si, Le, agaje isi na Babilon welata ihe nile nke ulo Jehova ub͕u a ngwa ngwa: n'ihi na amuma ugha ka ndi ahu nēburu unu.

17. Unu egela ha nti; fènu eze Babilon, we di ndu: n'ìhi gini ka obodo a gāghọ nkpọnkpọ ebe?

18. Ma ọ buru na ndi-amuma ka ha bu, ọ buru na okwa na okwu Jehova di ha n'ọnu, biko, ka ha riọ Jehova nke usu nile nke ndi-agha aririọ, ka ihe nile nke fọduru n'ulo Jehova, na n'ulo eze Juda, na nime Jerusalem, we ghara ibà na Babilon.

19. N'ihi na okwu di otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha kwuru bayere ogidi nile, baye-kwa-ra oké osimiri ahu, baye-kwa-ra ihe-ndọkwasi nile, baye-kwa-ra ihe fọduru, bú nke fọduru n'obodo a,

20. nke Nebukadneza, bú eze Babilon, nāchighi, mb͕e o mere ka Jekonaia nwa Jehoiakim, bú eze Juda, si na Jerusalem je biri na Babilon, ya na ndi Juda na Jerusalem nile amara aha-ha;

21. e, okwu di otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Irael, kwuru bayere ihe nile fọduru n'ulo Jehova na n'ulo eze Juda, na nime Jerusalem, si:

22. na Babilon ka agēbubà ha, ọ bu kwa n'ebe ahu ka ha gādi, rue ubọchi M'gēleta ha, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta); mb͕e ahu ka M'gēbugota ha, bulata n'ebe a.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Jeremaia 27