7. Ndi-nchu-àjà na ndi-amuma na ndi Israel nile we nu ka Jeremaia nēkwu okwu ndia n'ulo Jehova.
8. O rue, mb͕e Jeremaia kwubìri okwu nile nke Jehova nyere ya n'iwu igwa ndi Israel nile, na ndi-nchu-àjà na ndi-amuma na ndi Israel nile jidere ya, si, I ghaghi inwu anwu.
9. Gini mere i buworo amuma n'aha Jehova, si, Ulo a gādi ka Shailo, obodo a gābu kwa nkpọnkpọ ebe, ghara inwe onye-obibi? Ewe kpọkọta ndi Israel nile n'ebe Jeremaia nọ n'ulo Jehova.
10. Ndi-isi Juda we nu ihe ndia, ha we si n'ulo eze rigota n'ulo Jehova; ha we nọdu ala n'oghere ọnu-uzọ-ama ọhu nke ulo Jehova.
11. Ndi-nchu-àjà na ndi-amuma we gwa ndi-isi na ndi Israel nile okwu, si, Ikpé ọnwu kwesiri nwoke a; n'ihi na o buwo amuma megide obodo a, dika unu jiworo nti-unu nu.
12. Jeremaia we gwa ndi-isi nile, gwa ndi Israel nile, okwu, si, Jehova ziterem ibu amuma okwu nile nke unu nuworo megide ulo a na imegide obodo a.
13. Ma ub͕u a menu ka uzọ nile unu na omume nile unu di nma, ge-kwa-nu nti olu Jehova, bú Chineke-unu; Jehova gēchèghari kwa n'ihe ọjọ ahu nke O kwuworo megide unu.
14. Ma mu onwem, le, adim n'aka-unu: menum ka o si di nma na ka o si zie ezie n'anya-unu.
15. Nání, maranu nke-ọma na, ọ buru na unu eme ka m'nwua, ọbara nke nēmeghi ihe ọjọ ka unu onwe-unu nātukwasi n'aru unu, na n'aru obodo a, na n'aru ndi bi ya: n'ihi na n'ezi-okwu Jehova ezitewom ibiakute unu ikwu okwu ndia nile na nti-unu.
16. Ndi-isi na ndi Israel nile we si ndi-nchu-àjà, si kwa ndi-amuma, Ọ dighi ikpé ọnwu kwesiri nwoke a; n'ihi na ọ bu n'aha Jehova, bú Chineke-ayi, ka gwaworo ayi okwu.