Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jeremaia 26:11-19 Bible Nso (IGBOB)

11. Ndi-nchu-àjà na ndi-amuma we gwa ndi-isi na ndi Israel nile okwu, si, Ikpé ọnwu kwesiri nwoke a; n'ihi na o buwo amuma megide obodo a, dika unu jiworo nti-unu nu.

12. Jeremaia we gwa ndi-isi nile, gwa ndi Israel nile, okwu, si, Jehova ziterem ibu amuma okwu nile nke unu nuworo megide ulo a na imegide obodo a.

13. Ma ub͕u a menu ka uzọ nile unu na omume nile unu di nma, ge-kwa-nu nti olu Jehova, bú Chineke-unu; Jehova gēchèghari kwa n'ihe ọjọ ahu nke O kwuworo megide unu.

14. Ma mu onwem, le, adim n'aka-unu: menum ka o si di nma na ka o si zie ezie n'anya-unu.

15. Nání, maranu nke-ọma na, ọ buru na unu eme ka m'nwua, ọbara nke nēmeghi ihe ọjọ ka unu onwe-unu nātukwasi n'aru unu, na n'aru obodo a, na n'aru ndi bi ya: n'ihi na n'ezi-okwu Jehova ezitewom ibiakute unu ikwu okwu ndia nile na nti-unu.

16. Ndi-isi na ndi Israel nile we si ndi-nchu-àjà, si kwa ndi-amuma, Ọ dighi ikpé ọnwu kwesiri nwoke a; n'ihi na ọ bu n'aha Jehova, bú Chineke-ayi, ka gwaworo ayi okwu.

17. Ufọdu nime ndi-okenye ala we bilie, gwa nkpọkọta ahu nile nke ndi Israel okwu, si,

18. Maika onye Moreshet nēburi amuma n'ubọchi Hezekaia, bú eze Juda; o we gwa ndi Juda nile okwu, si, Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri: Agēji ploughi gwu Zaion dika ubi, Jerusalem gāghọ kwa obo-ihe obo-ihe, ugwu nke ulo ahu gādi kwa ka ebe di elu nke oké ọhia.

19. Hezekaia, bú eze Juda, na Juda nile, hà mere ya ka ọ nwua ma-ọli? ọ̀ tughi egwu Jehova, we chọ ka iru Jehova dajua, Jehova we chègharia n'ihe ọjọ ahu nke O kwururi megide ha? Ma ayi onwe-ayi nēme ihe ọjọ di uku megide nkpuru-obi-ayi.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Jeremaia 26