Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jeremaia 18:2-11 Bible Nso (IGBOB)

2. Bilie, rida n'ulo ọkpu-ite, ọ bu kwa n'ebe ahu ka M'gēme ka i nu okwum.

3. M'we rida n'ulo ọkpu-ite, ma, le, ọ nēje ozi-ya n'elu wheel-ya abua.

4. Ewe bibie ihe onye ahu ji urọ akpu n'aka ọkpu-ite ahu, o we kpu kwa ya ọzọ ihe di iche, dika o ziri ezi n'anya ọkpu-ite ahu ikpu ya.

5. Okwu Jehova we ruem nti, si,

6. Àpughm ime unu dika ọkpu-ite a mere, unu ulo Israel? ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta. Le, dika urọ si di n'aka ọkpu-ite a, otú a ka unu onwe-unu di n'akam, unu ulo Israel.

7. N'otù ntabi-anya ahu mb͕e M'nēkwu okwu bayere mba ọ bula, iropu ya na ikwada ya na ime ka ọ la n'iyì;

8. ọ buru na mba ahu nke M'kwuworo okwu bayere ya esi n'ihe ọjọ ya chigharia, M'gēchèghari kwa n'ihe ọjọ ahu nke M'chère ime ya.

9. Ọzọ, n'otù ntabi-anya ahu mb͕e M'nēkwu okwu bayere mba ọ bula, baye-kwa-ra ala-eze ọ bula, iwu ya dika ulo na iku ya dika osisi;

10. ọ buru na o me ihe jọrọ njọ n'anyam, we ghara ige nti n'olum, M'gēchèghari kwa n'ezi ihe ahu, nke M'siri na M'gēji me ya nma.

11. Ma ub͕u a, biko, gwa ndi Juda, gwa kwa ndi bi na Jerusalem, okwu, si, Otú a ka Jehova siri: Le, Mu onwem nākpu ihe ọjọ megide unu, nēchè kwa èchìchè megide unu: biko, sinu, onye ọ bula n'uzọ ọjọ ya, lata, me kwa ka uzọ nile unu na omume nile unu di nma.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Jeremaia 18