Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jeremaia 15:12-17 Bible Nso (IGBOB)

12. Àgētiji ígwè si n'Ugwu puta, na ọla?

13. Ume-gi na àkù-gi nile ka M'gēnye ka ọ buru ihe-nluta-n'agha, ọ bughi n'ihi ọnu-ahia, ma n'ihi nmehie-gi nile, ọbuná n'ókè-ala-gi nile.

14. M'gēme kwa ka ha soro ndi-iro-gi gabiga n'ala i nāmagh: n'ihi na amuyewo ọku n'iwem, n'aru unu ka ọ gēre.

15. Gi mara, Jehova: chetam, letakwam, we bọ̀rọm ndi nēsob͕um ọ́bọ̀; ewepulam n'eweghi-iwe-ọsọsọ nke Gi: mara na eburuwom ita-uta n'ihi Gi.

16. Achọputawo okwu-Gi, m'we rie ha; okwu-Gi we ghọrọm ihe-obi-utọ na ọṅù obim: n'ihi na akpọkwasiwom aha-Gi, Jehova, Chineke nke usu nile nke ndi-agha.

17. Anọdughm ala n'ìzù nzuzo nke ndi nāchì ọchì nke-uku, aṅurighkwam ọṅu: n'ihi aka-Gi náním otú nọduru ala; n'ihi na oké iwe ka I jiworo mejuem.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Jeremaia 15