Ume-gi na àkù-gi nile ka M'gēnye ka ọ buru ihe-nluta-n'agha, ọ bughi n'ihi ọnu-ahia, ma n'ihi nmehie-gi nile, ọbuná n'ókè-ala-gi nile.