Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jeremaia 14:13-18 Bible Nso (IGBOB)

13. M'we si, Ewó, Onye-nwe-ayi Jehova! le, ndi-amuma nāsi ha, Unu agaghi-ahu mma-agha, unu agaghi-enwe kwa oké unwu; kama udo nke ezi-okwu ka M'gēnye unu n'ebe a.

14. Jehova we sim, Amuma ugha ka ndi-amuma nēbu n'aham: eziteghm ha, enyekwaghm ha iwu, agwakwaghm ha okwu: amuma ọhù ugha, na nke iju arusi ase, na nke ihe-efu, na nke aghughọ nke obi-ha, ka ha nēburu unu.

15. N'ihi nka ka Jehova ji kwue okwu di otú a bayere ndi-amuma ahu ndi nēbu amuma n'aha m, ma Mu onwem eziteghi ha, ma ha onwe-ha nāsi, Mma-agha na oké unwu agaghi-adi n'ala nka: Ọ si, Agēji mma-agha, ji kwa oké unwu, me ka ndi-amuma ahu gwusia.

16. Ọzọ, ndi ahu nke ha onwe-ha nēburu amuma gābu ndi anētufu n'èzí nile nke Jerusalem n'ihi oké unwu na mma-agha; ọ dighi kwa onye nēlì ozu ha gēnwe, ha onwe-ha, na ndinyom-ha, na umu-ha ndikom, na umu-ha ndinyom: n'ihi na M'gāwukwasi ha ihe ọjọ ha.

17. I gāgwa kwa ha okwu a, si, Ka anya-miri si n'anyam erùda abali na ehihie, ka ha ghara kwa iguzo du; n'ihi na nb͕aji ukwu na aka di uku ka ejiworo b͕aji ada ndim nāmaghi nwoke, ọ bu ntiputa-ọnyá nke jọrọ njọ nke-uku.

18. Ọ buru na apuam je n'ọhia, le, ndi ejiworo mma-agha b͕u! ma ọ buru na abàm n'obodo a, le, ndi nāria ọria site n'oké unwu! n'ihi na ma onye-amuma ma onye-nchu-àjà, ha akpaghariwo n'ala, ma ha amaghi ihe.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Jeremaia 14