Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jenesis 9:23-28 Bible Nso (IGBOB)

23. Shem na Jefet we chiri uwe-nb͕okwasi, tukwasi n'ubu ha abua, were azu-ha je, kpuchie ọtọ nna-ha; ma iru-ha di n'azu, ha ahughi kwa ọtọ nna-ha.

24. Noa we teta n'ura manya-vine-ya, mara ihe nwa-ya nwoke nke-ntà mere ya.

25. Ọ we si,Onye anābu ọnu ka Kenean bu;Orù nke ndi-orù ka ọ gāburu umu-nne-ya ndikom.

26. Ọ si kwa,Onye agọziri agọzi ka Jehova, bú Chineke nke Shem, bu;Ka Kenean ghọkwara ha orù.

27. Ka Chineke me ka Jefet setia,Ya biri kwa n'ulo-ikwū nile nke Shem;Ka Kenean ghọ-kwa-ra ha orù.

28. Noa we di ndu, mb͕e iju-miri ahu gasiri, ọgu arọ iri-na-asa na arọ iri.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Jenesis 9