Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jenesis 7:18-24 Bible Nso (IGBOB)

18. Miri ahu di ike, ba uba nke-uku n'elu uwa; ub͕ọ ahu we nāgaghari n'elu miri.

19. Miri ahu di ike nke-uku n'elu uwa; ewe kpuchie ugwu nile di elu nke di n'okpuru elu-igwe nile.

20. Cubit iri na ise ka miri ahu di ike site n'elu ugwu; ewe kpuchie ugwu nile.

21. Anu-aru nile nke nākpu akpu n'elu uwa we kubie ume, nime anu-ufe, na nime anu-ulo, na nime anu-ọhia, na nime ihe nile ọ bula nēnuputa enuputa nke nēnuputa n'elu uwa, na madu nile ọ bula:

22. ihe ọ bula nke ume nke mọ nke ndu di n'oghere-imi-ya abua, nime ihe nile ọ bula nke di n'ala-ọkpọ-nku, ọ nwuru anwu.

23. O we kpochapu ihe nile ọ bula di ndu nke di n'elu ala, ma madu, ma anumanu, ma ihe nākpu akpu, ma anu-ufe nke elu-igwe: ewe kpochapu ha n'uwa: ọ we fọdu nání Noa na ndi ya na ha nọ n'ub͕ọ ahu.

24. Miri we di ike n'elu uwa ọgu ubọchi asa na iri.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Jenesis 7