Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jenesis 7:10-22 Bible Nso (IGBOB)

10. O rue, mb͕e ubọchi asa ahu gasiri, na miri nke iju-miri ahu di n'elu uwa.

11. N'arọ nke-nnù-na-ọgu-iri nke ndu Noa, n'ọnwa nke-abua, n'ubọchi nke-iri-na-asa nke ọnwa, n'ubọchi ahu ka ab͕awara isi-iyi nile nke oké ob͕u-miri, emeghe-kwa-ra window nile nke elu-igwe.

12. Oké miri-ozuzo ahu we di n'elu uwa ọgu ubọchi abua ehihie na abali.

13. N'otù ubọchi ahu ka Noa, na Shem na Ham na Jefet, bú umu-ndikom Noa, na nwunye Noa, ha na nwunye nile nke umu-ya ndikom, bara n'ub͕ọ ahu;

14. ha onwe-ha, na anu-ọhia nile ọ bula di iche iche, na anu-ulo nile ọ bula di iche iche, na ihe nile ọ bula di iche iche nākpu akpu nke nākpu akpu n'elu uwa, na anu-ufe nile ọ bula di iche iche, aha nnunu nile ọ bula.

15. Ha we bakuru Noa n'ub͕ọ ahu, abua abua nime anu-aru nile nke ume nke ndu di nime ya.

16. Ndi nāba n'ub͕ọ bara oke na nwunye sitere n'anu-aru nile, dika Chineke nyere ya iwu: Jehova we mechibido ya uzọ nime.

17. Iju-miri ahu we di n'elu uwa ọgu ubọchi abua; miri ahu we ba uba, bulie ub͕ọ ahu, ewe si n'elu uwa bulie ya elu.

18. Miri ahu di ike, ba uba nke-uku n'elu uwa; ub͕ọ ahu we nāgaghari n'elu miri.

19. Miri ahu di ike nke-uku n'elu uwa; ewe kpuchie ugwu nile di elu nke di n'okpuru elu-igwe nile.

20. Cubit iri na ise ka miri ahu di ike site n'elu ugwu; ewe kpuchie ugwu nile.

21. Anu-aru nile nke nākpu akpu n'elu uwa we kubie ume, nime anu-ufe, na nime anu-ulo, na nime anu-ọhia, na nime ihe nile ọ bula nēnuputa enuputa nke nēnuputa n'elu uwa, na madu nile ọ bula:

22. ihe ọ bula nke ume nke mọ nke ndu di n'oghere-imi-ya abua, nime ihe nile ọ bula nke di n'ala-ọkpọ-nku, ọ nwuru anwu.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Jenesis 7