Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jenesis 6:9-22 Bible Nso (IGBOB)

9. Ndia bu osuso-ọmumu Noa. Noa bu onye ezi omume, onye zuru okè n'ọb͕ọ-ya nile: Noa na Chineke yikọrọ nējeghari.

10. Noa we mua umu-ndikom atọ, Shem, na Ham, na Jefet.

11. Ma ebibiri uwa n'iru Chineke, uwa juputakwara n'ihe-ike.

12. Chineke we hu uwa, ma, le, ebibiri ya; n'ihi na anu-aru nile, bú madu, bibiri uzọ-ya n'elu uwa.

13. Chineke we si Noa, Ọgwugwu anu-aru nile abiawo n'irum; n'ihi na uwa juputara n'ihe-ike site na ha; ma, le, M'gēbibi ha na uwa.

14. Mere onwe-gi ub͕ọ nke osisi gopher; ulo-nwubi di iche iche ka i gēme n'ub͕ọ ahu, were kwa bitumen techie ya ime na azu.

15. Nka bu kwa otú i gēme ya: ọgú cubit iri-na-ise ka ogologo ub͕ọ ahu bu, ọgu cubit abua na iri bu obosara-ya, orú cubit na iri bu idi-elu-ya.

16. Oghere inye ìhè ka i gēmere ub͕ọ ahu, rue otù cubit ka i gēmesi kwa ya site n'elu; ọnu-uzọ ub͕ọ ahu ka i gētiye kwa n'akuku-ya; okpukpu nke-ala na nke-abua na nke-atọ ka i gēme ya.

17. Ma Mu onwem, le, anameme ka iju-miri biakwasi uwa, ibibi anu-aru nile, nke ume nke ndu di nime ya, ka ọ pua n'okpuru elu-igwe; ihe nile nke di n'uwa gēkubi ume.

18. Ma M'gēme ka ọb͕ub͕a-ndum guzosi ike n'ebe i nọ; i gābata kwa n'ub͕ọ ahu, gi onwe-gi, na umu-gi ndikom, na nwunye-gi, na nwunye nile nke umu-gi ndikom tiyere onwe-gi.

19. Ọ bu kwa ufọdu nime anu nile ọ bula nke di ndu, nime anu-aru nile, abua abua n'aha nile ọ bula, ka i gēme ka ha bata n'ub͕ọ, idebe ha ndu tiyere onwe-gi; oke na nwunye ka ha gābu.

20. Nime anu-ufe di iche iche, na nime anu-ulo di iche iche, nime ihe nile ọ bula di iche iche nke nākpu n'ala, abua abua n'aha nile ọ bula gābiakute gi, idebe ha ndu.

21. Gi onwe-gi kwa, were n'onwe-gi ufọdu nime ihe-oriri nile nke anēri eri, gi chikọta ya n'ebe i nọ; ọ gāburu gi, bukwara ha, ihe-oriri.

22. Noa we me ya; dika iwu nile si di nke Chineke nyere ya, otú a ka o mere.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Jenesis 6