Ma M'gēme ka ọb͕ub͕a-ndum guzosi ike n'ebe i nọ; i gābata kwa n'ub͕ọ ahu, gi onwe-gi, na umu-gi ndikom, na nwunye-gi, na nwunye nile nke umu-gi ndikom tiyere onwe-gi.