Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jenesis 6:17-22 Bible Nso (IGBOB)

17. Ma Mu onwem, le, anameme ka iju-miri biakwasi uwa, ibibi anu-aru nile, nke ume nke ndu di nime ya, ka ọ pua n'okpuru elu-igwe; ihe nile nke di n'uwa gēkubi ume.

18. Ma M'gēme ka ọb͕ub͕a-ndum guzosi ike n'ebe i nọ; i gābata kwa n'ub͕ọ ahu, gi onwe-gi, na umu-gi ndikom, na nwunye-gi, na nwunye nile nke umu-gi ndikom tiyere onwe-gi.

19. Ọ bu kwa ufọdu nime anu nile ọ bula nke di ndu, nime anu-aru nile, abua abua n'aha nile ọ bula, ka i gēme ka ha bata n'ub͕ọ, idebe ha ndu tiyere onwe-gi; oke na nwunye ka ha gābu.

20. Nime anu-ufe di iche iche, na nime anu-ulo di iche iche, nime ihe nile ọ bula di iche iche nke nākpu n'ala, abua abua n'aha nile ọ bula gābiakute gi, idebe ha ndu.

21. Gi onwe-gi kwa, were n'onwe-gi ufọdu nime ihe-oriri nile nke anēri eri, gi chikọta ya n'ebe i nọ; ọ gāburu gi, bukwara ha, ihe-oriri.

22. Noa we me ya; dika iwu nile si di nke Chineke nyere ya, otú a ka o mere.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Jenesis 6