Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jenesis 49:21-33 Bible Nso (IGBOB)

21. Naftali bu nne-ele arapuworo arapu:Bú onye ahu nke nēnye okwu-ọnu nile di utọ.

22. Nwa osisi nke nāmi nkpuru ka Josef bu,Nwa osisi nke nāmi nkpuru nke di n'akuku isi-iyi;Umu-ya ndinyom nāribiga mb͕idi.

23. Ndi-ọ̀kà-uta mere ya ihe-ilú,B͕a kwa ya àkú, kpọ kwa ya asì:

24. Ma uta-ya nānọgide n'idi-ike,Ab͕a-kwa-ra ogwe-aka-ya abua ume,Site n'aka Dike nke Jekob,(N'ebe ahu ka onye-ọzùzù-aturu si bia, bú nkume Israel,)

25. Site na Chineke nke nna-gi; Ya yere gi aka!Na Onye Nke puru ime ihe nile; Ya gọzie gi!Ngọzi nile nke elu-igwe site n'elu,Ngọzi nile nke ob͕u-miri nke nāma-kpu n'okpuru,Ngọzi nile nke ara na nke àkpà-nwa.

26. Ngọzi nile nke nna-giAdiwo ike kari ngọzi nile nke ndi murumRue ókè nke ugwu ebighi-ebi:Ha gādi n'isi Josef,Na n'opù-n'isi nke onye ekewapuru n'etiti umu-nne-ya.

27. Benjamin bu wolf nke nādọb͕u anu:N'ututu o nēri anu ọ dọb͕uru,N'anyasi o nēkesa kwa ihe ọ kwatara.

28. Ndia nile bu ebo Israel iri na abua: nka bu kwa ihe nna-ha gwara ha, ọ we gọzie ha; onye ọ bula n'ihe nke di ka ngọzi-ya si di, otú a ka ọ gọziri ha.

29. Ọ we nye ha iwu, si ha, Anāchikọta mu onwem na ndi nkem n'ala-mọ: lìenum n'ebe nnam-hà di n'ọb͕à nke di n'ọhia nke Efron, bú onye Het,

30. n'ọb͕à nke di n'ọhia Makpila, nke di n'iru Mamre, n'ala Kenean, nke Abraham zutara, ya na ọhia ahu, n'aka Efron onye Het, ka ọ buru ihe-onwunwe nke gābu ala-ílì:

31. n'ebe ahu ka ha lìri Abraham na Sera nwunye-ya; n'ebe ahu ka ha lìri Aisak na Rebeka nwunye-ya; ọ bu kwa n'ebe ahu ka m'liri Lia:

32. azutara ọhia ahu na ọb͕à ahu nke di nime ya n'aka umu Het.

33. Jekob we nyebie umu-ya ndikom iwu, chikọta ukwu-ya n'ihe-ndina-ya, kubie ume, ewe chikọta ya na umu-nna-ya n'ala-mọ.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Jenesis 49