Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jenesis 49:19-28 Bible Nso (IGBOB)

19. Gad, usu ndi nāpunara madu ihe gākpagide ya:Ma ya onwe-ya onwe-ya gākpagide ha n'ikiri-ukwu.

20. Asha ka abuba si aputa, bú nrí-ya,Ya onwe-ya gēnye kwa ihe-utọ di iche iche nke eze.

21. Naftali bu nne-ele arapuworo arapu:Bú onye ahu nke nēnye okwu-ọnu nile di utọ.

22. Nwa osisi nke nāmi nkpuru ka Josef bu,Nwa osisi nke nāmi nkpuru nke di n'akuku isi-iyi;Umu-ya ndinyom nāribiga mb͕idi.

23. Ndi-ọ̀kà-uta mere ya ihe-ilú,B͕a kwa ya àkú, kpọ kwa ya asì:

24. Ma uta-ya nānọgide n'idi-ike,Ab͕a-kwa-ra ogwe-aka-ya abua ume,Site n'aka Dike nke Jekob,(N'ebe ahu ka onye-ọzùzù-aturu si bia, bú nkume Israel,)

25. Site na Chineke nke nna-gi; Ya yere gi aka!Na Onye Nke puru ime ihe nile; Ya gọzie gi!Ngọzi nile nke elu-igwe site n'elu,Ngọzi nile nke ob͕u-miri nke nāma-kpu n'okpuru,Ngọzi nile nke ara na nke àkpà-nwa.

26. Ngọzi nile nke nna-giAdiwo ike kari ngọzi nile nke ndi murumRue ókè nke ugwu ebighi-ebi:Ha gādi n'isi Josef,Na n'opù-n'isi nke onye ekewapuru n'etiti umu-nne-ya.

27. Benjamin bu wolf nke nādọb͕u anu:N'ututu o nēri anu ọ dọb͕uru,N'anyasi o nēkesa kwa ihe ọ kwatara.

28. Ndia nile bu ebo Israel iri na abua: nka bu kwa ihe nna-ha gwara ha, ọ we gọzie ha; onye ọ bula n'ihe nke di ka ngọzi-ya si di, otú a ka ọ gọziri ha.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Jenesis 49