Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jenesis 48:3-10 Bible Nso (IGBOB)

3. Jekob we si Josef, Chineke Nke puru ime ihe nile mere ka m'hu Ya anya na Luz n'ala Kenean, Ọ gọziem,

4. sim, Le, M'nēme gi ka i mua ọmùmù, M'gēme kwa gi ka i ba uba, M'gēme kwa gi ka i ghọ nkpọkọta ndi di iche iche; M'gēnye kwa nkpuru-gi gānọchi gi ala nka, ka ọ buru ihe-onwunwe ebighi-ebi.

5. Ma ub͕u a umu-gi ndikom abua, ndi amuru nye gi n'ala Ijipt tutu mu abiakute gi n'Ijipt, nkem ka ha bu; Efraim na Manase, dika Reuben na Simeon, gābu ndi m'nwere.

6. Ma umu-gi, ndi i musoworo ha, ọ bu gi nwe ha; n'aha umu-nne-ha ka agākpọ ha n'ihe-nketa-ha.

7. Ma mu onwem, mb͕e m'siri na Padan bia, Rechel nwuru n'akukum n'ala Kenean n'uzọ, mb͕e uzọ foduru ibiaru Efrat: m'we lìe ya n'ebe ahu n'uzọ Efrat (nke ahu bu Bet-lehem).

8. Israel we hu umu-ndikom Josef, ọ si Òle ndi bu ndia?

9. Josef we si nna-ya, Umum ka ha bu, ndi Chineke nyeworom n'ebe a. Ọ si, Biko, chitaram ha, m'gāgọzi ha.

10. Ma anya Israel di arọ́ site n'agadi ọ bu, ọ pughi ihu uzọ. O me ka ha biakute ya nso; o we sutu ha ọnu, b͕akua ha.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Jenesis 48