Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jenesis 47:2-17 Bible Nso (IGBOB)

2. O we si n'etiti umu-nne-ya nile chiri ndikom ise, guzo ha n'iru Fero.

3. Fero we si umu-nne-ya, Gini bu ọlu unu nālu? Ha si Fero, Ndi-ọzùzù ìgwè ewu na aturu ka ndi-orù-gi bu, ma ayi onwe-ayi, ma nna-ayi-hà.

4. Ha we si Fero, Inọ dika ọbìa n'ala nka ka ayi biaworo; n'ihi na ọ dighi ihe eji azù ìgwè ewu na aturu ahu nke ndi-orù-gi nwere; n'ihi na oké unwu a di arọ́ n'ala Kenean: ub͕u a kwa, biko, ka ndi-orù-gi biri n'ala Goshen.

5. Fero we gwa Josef okwu, si, Nna-gi na umu-nne-gi abiakutewo gi:

6. ala Ijipt, n'iru gi ka ọ di; me ka nna-gi na umu-nne-gi biri n'ebe kachasi nma nke ala nka; ha gēbiri n'ala Goshen: ọ buru kwa na i mara, si, na ndi-dìnkpà dí n'etiti ha, i gēdo kwa ha ndi-isi anu-ulo m'nwere.

7. Josef we me ka Jekob nna-ya bata, o guzo ya n'iru Fero: Jekob we gọzie Fero.

8. Fero we si Jekob, Ùbọchi arọ ndu-gi di ole?

9. Jekob we si Fero, Ubọchi arọ nke ọnọdu-ọbìam nile di ọgu arọ isi na iri: ha di ole-na-ole, jọ kwa njọ, bú ubọchi arọ ndum, ha erughi kwa ubọchi arọ ndu nke nnam-hà n'ubọchi ọnọdu-ọbia-ha.

10. Jekob we gọzie Fero, si n'iru Fero pua.

11. Josef we me ka nna-ya na umu-nne-ya biri n'ala, ọ nye kwa ha ihe-onwunwe n'ala Ijipt, n'ebe kachasi nma nke ala ahu, n'ala Rameses, dika Fero nyere iwu.

12. Josef were nri zùa nna-ya, na umunne ya, na ulo nile nke nna-ya, dika ọnu-ọgugu nke umu-ntakiri si di.

13. Nri adighi n'ala ahu nile; n'ihi na oké unwu ahu di arọ́ nke-uku, ala Ijipt na ala Kenean we nāda mbà n'ihi oké unwu ahu.

14. Josef we chikọta ego nile anāchọta n'ala Ijipt, na n'ala Kenean, n'ọnọdu ọka ndi ahu nāzu: Josef we chita ego ahu n'ulo Fero.

15. Ego we gwu-chapu n'ala Ijipt, na n'ala Kenean, ndi Ijipt nile we biakute Josef, si, Nye ayi nri, n'ihi gini ka ayi nānwu n'iru gi? n'ihi na ego agwuwo.

16. Josef we si, Nyenu anu-ulo-unu; ka m'nye kwa unu nri n'ọnọdu anu-ulo-unu, ma ọ buru na ego agwu.

17. Ha we chiri anu-ulo-ha biakute Josef: Josef we nye ha nri n'ọnọdu inyinya-ha, na n'ọnọdu anu-ulo-ha, bú ìgwè ewu na aturu, na n'ọnọdu anu-ulo-ha, bú ìgwè ehi, na n'ọnọdu inyinya-ibu-ha, we were nri nāzù ha n'arọ ahu n'ọnọdu anu-ulo-ha nile.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Jenesis 47