Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jenesis 42:31-38 Bible Nso (IGBOB)

31. Ayi we si ya, Ndi ziri ezi ka ayi bu, ayi abughi ndi-nledo:

32. umu-nne iri na abua ka ayi bu, umu nke nna-ayi; otù anọghi ndu, nke-ntà di kwa n'aka nna-ayi taa n'ala Kenean.

33. Nwoke ahu, bú onye-nwe ala ahu, we si ayi, Nime nka ka m'gāmara na ndi ziri ezi ka unu bu: kwenu ka otù nwa-nne-unu nọdu n'akam, ma werenu ọka n'ihi oké unwu nke ulo-unu, la:

34. ma menu ka nwa-nne-unu nke-ntà biakute m: ka m'mara kwa na ọ dighi ndi-nledo unu bu, kama unu bu ndi ziri ezi: nwa-nne-unu ka m'gēnye unu, ọ bu kwa n'ala nka ka unu gāzu ahia.

35. O rue na, mb͕e ha nāwupu ihe di n'akpa-ha, le, ngwungwu ego nwoke ọ bula di n'akpa-ya: ha we hu ngwugwu ego-ha, ha onwe-ha na nna-ha, ha we tua egwu.

36. Jekob nna-ha we si ha, Mu ka unu b͕abaworo aka umu: Josef anọghi ndu, Simeon anọghi kwa ndu, ọ bu kwa Benjamin ka unu gēkuru: mu ka ihe ndia nile biakwasiworo.

37. Reuben we gwa nna-ya okwu, si, Umum ndikom abua ka i gēme ka ha nwua, ma ọ buru na emeghi m ka ọ biakute gi: nye ya n'akam, mu onwem gēme kwa ka ọ laghachikute gi.

38. Ọ si, Nwam agaghi-eso unu rida; n'ihi na nwa-nne-ya anwuwo, ya onwe-ya, nání ya, fọdukwara: asi na ajọ ihe adakwasi ya n'uzọ nke unu nēje na ya, unu gēweda kwa isi-awọm rue ala-mọ na nwuta.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Jenesis 42