Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jenesis 42:1-12 Bible Nso (IGBOB)

1. Jekob we hu na ọka di n'Ijipt, Jekob we si umu-ya ndikom, N'ìhi gini ka unu nēlerita onwe-unu anya?

2. Ọ si kwa, Le, anuwom na ọka di n'Ijipt: ridanu n'ebe ahu, si n'ebe ahu zutara ayi; ka ayi we di ndu, ghara inwu anwu.

3. Umu-nne Josef iri we rida isi n'Ijipt zuta ọka.

4. Ma Benjamin, bú nwa-nne Josef, ka Jekob nēzigaghi ka ya na umu-nne-ya yikọ je; n'ihi na ọ siri, Ka ajọ ihe we ghara idakwasi ya.

5. Umu Israel we bia izuru ọka n'etiti ndi nābia: n'ihi na oké unwu ahu di n'ala Kenean.

6. Ma Josef, ya onwe-ya bu onye-isi ala ahu: ya onwe-ya bu onye nēre ọka nye ndi ala ahu nile: umu-nne Josef we bia, kpọ isi ala nye ya, kpuchie iru-ha n'ala.

7. Josef we hu umu-nne-ya, ọ mata ha, ma ọ mere onwe-ya dika onye ala ọzọ n'ebe ha nọ, ọ we kpayere ha uka ike, si ha, Òle ebe unu si bia? Ha si, Site n'ala Kenean izuru ihe-oriri.

8. Josef we mata umu-nne-ya, ma ha onwe-ha amataghi ya.

9. Josef we cheta nrọ abua ahu nke ọ rọrọ bayere ha, ọ si ha, Ndi-nledo ka unu bu; ihu ọb͕ub͕a-ọtọ ala ka unu biaworo.

10. Ha si ya, É-è, onye-nwem, kama ndi-orù-gi abiawo izuru ihe-oriri.

11. Ayi nile, umu otù nwoke ka ayi bu, ndi ziri ezi ka ayi bu, ndi-orù-gi abughi ndi-nledo.

12. Ọ si ha, É-è, kama ọ bu ọb͕ub͕a-ọtọ ala ka unu biaworo ihu.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Jenesis 42