Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jenesis 41:45-56 Bible Nso (IGBOB)

45. Fero we kpọ aha Josef Zafenat-pania; o nye ya Asenat, bú nwa-nwayi Poti-fera onye-nchu-àjà nke On, na nwunye. Josef we pua jeghari n'ala Ijipt.

46. Josef b͕ara orú arọ na iri mb͕e o guzoro n'iru Fero eze Ijipt. Josef we si n'iru Fero pua, gabiga n'ala Ijipt nile.

47. N'arọ asa ahu nke anēriju afọ ala we nēme nri ri nne.

48. O we chikọta ihe-oriri nile nke arọ asa ahu nke di n'ala Ijipt, tiye ihe-oriri ahu n'obodo nile: ihe-oriri nke ubi nke obodo ọ bula nke di ya gburugburu ka o tiyere n'etiti ya.

49. Josef we kwakọba ọka dika ájá nke oké osimiri, nēme ka ọ ba uba nke-uku, rue mb͕e ọ rapuru igu ya ọnu; n'ihi na ọ dighi nguta.

50. Amuru umu-ndikom abua nye Josef tutu arọ oké unwu abia, ndi Asenat nwa-nwayi Poti-fera, bú onye-nchu-àjà nke On, muru nye ya.

51. Josef we kpọ aha ọkpara-ya Manase: si, N'ihi na Chineke emewom ka m'chezọ ndọb͕u nile m'dọb͕uru onwem n'ọlu na ulo nile nke nnam.

52. Aha nke-abua ka ọ kpọrọ Efraim: si, N'ihi na Chineke emewom ka m'mua ọmùmù n'ala ewedaram ala.

53. Arọ asa ahu nke nriju-afọ, nke di n'ala Ijipt, we gwu.

54. Arọ asa ahu nke oké unwu we malite ibia, dika Josef siri; oké unwu we di n'ala nile; ma nri di n'ala Ijipt nile.

55. Agu we nāgu ala Ijipt nile, ndi ala ahu we tikue Fero inye ha nri: Fero we si ndi Ijipt nile, Jekurunu Josef, ihe ọ si unu me, menu ya.

56. Oké unwu ahu we dikwasi n'elu uwa nile: Josef we meghe ebe nile nke ọka di nime ha, ọ we re ọka nye ndi Ijipt; oké unwu ahu we sie ike n'ala Ijipt.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Jenesis 41