Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jenesis 38:6-18 Bible Nso (IGBOB)

6. Juda we lutara Ia ọkpara-ya nwunye, nke aha-ya bu Tema.

7. Ma Ia, bú ọkpara Juda, jorọ njọ n'anya Jehova, Jehova we me ka ọ nwua.

8. Juda we si Onan, Bakuru nwunye nwa-nne-gi, we luara ya ọlu nwa-nne di, me ka nkpuru tolitere nwa-nne-gi.

9. Ma Onan mara na ọ bughi ya gēnwe nkpuru ahu; o we rue, na mb͕e ọ bula ọ bakuru nwunye nwa-nne-ya, na ọ wusiri ya n'ala, ka ọ we ghara inye nwa-nne-ya nkpuru.

10. Ma ihe ọ mere jọrọ njọ n'anya Jehova; O we me ka ọ nwu kwa.

11. Juda we si Tema, bú nwunye nwa-ya, Nọdu n'ọnọdu nwayi di-ya nwuru n'ulo nna-gi, rue mb͕e Shila, bú nwam, gētozù: n'ihi na ọ siri, Ka ya onwe-ya we ghara inwu kwa, dika umu-nne-ya. Tema we je nọdu n'ulo nna-ya.

12. Ubọchi gabigara we di ọtutu, nwa-nwayi Shua, bú nwunye Juda, we nwua; ewe kasie Juda obi, o we rigokuru ndi nākpacha aji ìgwè ewu na aturu-ya rue Timna, ya onwe-ya na Haira, bú enyì-ya, bú onye Adulam ahu.

13. Ewe gosi Tema, si, Le, nna di-gi nārigoru Timna ikpacha aji ìgwè ewu na aturu-ya.

14. O we chipu n'aru ya uwe ọnọdu nwayi di-ya nwuru nke ya, were ákwà-nkpudo-ya kpuchie onwe-ya, fuchi onwe-ya, nọdu n'onu-uzọ Enaim, nke di n'uzọ Timna; n'ihi na ọ huru na Shila etozuwori, ma eweghi ya onwe-ya nye ya na nwunye.

15. Juda we hu ya, che na ọ bu nwayi nākwa iko; n'ihi na o kpuchiri iru-ya.

16. O we si n'ije-ya wezuga onwe-ya jekuru ya n'uzọ, si, Biko, ngwa, ka m'bakuru gi: n'ihi na ọ maghi na nwunye nwa-ya ka ọ bu. Tema we si, Gini ka i gēnyem, ka i we bakurum?

17. Ọ si, Mu onwem gēzitere gi nwa-ewu sitere n'ìgwè ewu na aturu. Tema we si, Ì gēnyem ihe-ibe, rue mb͕e i gēzite ya?

18. Ọ si, Gini bu ihe-ibe nke m'gēnye gi? Tema we si, Nb͕a-aka-akàrà-gi na eriri mma gi, na nkpa-n'aka-gi nke di n'aka-gi. Ọ chiri ha nye ya, we bakuru ya, o we turu ime n'aka-ya.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Jenesis 38