Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jenesis 37:1-12 Bible Nso (IGBOB)

1. Jekob we biri n'ala ọnọdu-ọbìa nile nke nna-ya, n'ala Kenean.

2. Ndia bu osuso-ọmumu Jekob. Mb͕e Josef b͕ara arọ iri na asa, ọ nāzù ìgwè ewu na aturu, ya na umu-nne-ya; ya onwe-ya bu nání nwata, ya na umu Bilha na umu Zilpa, bú ndinyom nna-ya, yikọrọ zù ewu na aturu: Josef we wetara nna-ha akukọ ihe ọjọ ha.

3. Ma Israel huru Josef n'anya kari umu-ya nile, n'ihi na nwa agadi-ya ka ọ bu: o we mere ya uwe-nwuda nwere aka.

4. Umu-nne-ya we hu na ọ bu ya onwe-ya ka nna-ha huru n'anya kari umu-nne-ya nile; ha we kpọ ya asì, ha apughi kwa igwa ya okwu n'udo.

5. Josef we rọ nrọ, gosi ya umu-nne-ya: ha we kpọ ya asì ọzọ kari.

6. Ọ si ha, Biko, nurunu nrọ a nke m'rọworo:

7. ma, le, ayi onwe-ayi nēke ùkwù-ọka n'etiti ubi, ma, le, ùkwù-ọka nkem biliri, guzo kwa onwe-ya ọtọ; ma, le, ùkwù-ọka-unu nāb͕a gburugburu, kpọ isi ala nye ùkwù-ọka nkem.

8. Umu-nne-ya we si ya, Ì gābu eze-ayi n'ezie? ma-ọbu ì gāchi ayi n'ezie? Ha we kpọ ya asì ọzọ kari n'ihi nrọ-ya nile, na n'ihi okwu-ya nile.

9. Ọ we rọ kwa nrọ ọzọ, kọrọ ya umu-nne-ya, si, Le, arọwom nrọ ọzọ; ma, le, anyanwu na ọnwa na kpakpando iri na otù nākpọ isi ala nyem.

10. Ọ we kọrọ ya nna-ya, kọkwara umu-nne-ya; nna-ya we basiere ya nba ike, si ya, Gini bu nrọ a nke i rọworo? Mu onwem na nne-gi na umu-nne-gi, àyi gābia n'ezie ikpọ isi ala nye gi?

11. Umu-nne-ya we kwo ya ekworo; ma nna-ya debere okwu ahu.

12. Umu-nne ya we je izù ìgwè ewu na aturu nke nna-ha na Shekem.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Jenesis 37