Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jenesis 34:14-31 Bible Nso (IGBOB)

14. ha we si ha, Ayi apughi ime ihe a, iwere nwa-nne-ayi nwayi nye nwoke nke anēbighi úgwù; n'ihi na ihe-ita-uta ka ọ buru ayi:

15. ọ bu nání ma asi na unu eme nka ka ayi gēkwere unu: ọ buru na unu gādi ka ayi, ka ebìe nwoke ọ bula n'etiti unu úgwù;

16. ayi gēnye kwa unu umu-ayi ndinyom, ọ bu kwa umu-unu ndinyom ka ayi gēkuru n'onwe-ayi, ayi na unu gēbi kwa, ghọ otù ndi.

17. Ma ọ buru na unu agaghi-ege ayi nti, ka ebìe unu úgwù; ayi gēkuru kwa nwa-ayi nwayi, la.

18. Okwu-ha nile we di nma n'anya Hemoa, na n'anya Shekem, bú nwa Hemoa.

19. Okorọbia ahu alaghi kwa azu ime ihe ahu, n'ihi na ihe nwa-nwayi Jekob tọrọ ya utọ: ya onwe-ya nwekwara nsọpuru kari ulo nile nke nna-ya.

20. Hemoa na Shekem nwa-ya we bia n'ọnu-uzọ-ama obodo-ha, gwa ndikom obodo-ha okwu, si,

21. Ndikom ndia, ndi-udo ka ha bu n'etiti ayi; ka ha biri kwa n'ala-ayi, zu kwa ahia nime ya; ala-ayi-kwa, le, ọ sara mbara n'aka abua n'iru ha; ka ayi lutara onwe-ayi umu-ha ndinyom na nwunye, ka ayi nye kwa ha umu-ayi ndinyom.

22. Ọ bu nání ma asi na ayi eme nka ka ndikom ahu gēkwere ayi ka ayi na ha biri, ighọ otù ndi, ọ buru na ebìe nwoke, ọ bula n'etiti ayi úgwù, dika ha onwe-ha bu ndi ebiri úgwù.

23. Anu-ulo-ha, na ihe ha nwetara, na anumanu-ha nile, ọ̀ bughi ayi gēnwe ha? ka ayi me nání nka, ka ayi kwere ha, ayi na ha gēbi kwa.

24. Ndi nile ndi si n'ọnu-uzọ-ama obodo-ya nāpu we ge Hemoa, ge kwa Shekem nwa-ya, nti; ewe bìe nwoke ọ bula úgwù, ndi nile ndi si n'ọnu-uzọ-ama obodo-ya nāpu.

25. O rue n'ubọchi nke-atọ, mb͕e o nēb͕u ha nb͕u, na madu abua n'etiti umu-ndikom Jekob, bú Simeon na Livai, umu-nne Daina, were mma-agha-ha n'otù n'otù, biakwasi obodo ahu mb͕e ọ di na ntukwasi-obi, ha we b͕ue ndikom nile.

26. Hemoa na Shekem nwa-ya ka ha b͕u-kwa-ra n'ọnu mma-agha, ha we kuputa Daina n'ulo Shekem, pua.

27. Umu-ndikom Jekob biakwasiri ndi eb͕uru eb͕u, luta obodo ahu n'agha, n'ihi na ha merururi nwa-nne-ha nwayi.

28. Ìgwè ewu na aturu-ha na ìgwè ehi-ha na inyinya-ibu nile ha, na ihe nke di n'obodo ahu, na ihe nke di n'ohia-ya, ka ha chiri;

29. àkù-ha nile, na umu-ntakiri-ha nile, na ndinyom-ha, ka ha dọtara n'agha, luta kwa ha n'agha, bú ihe nile nke di n'ulo-ha.

30. Jekob we si Simeon na Livai, Unu emekpawom aru, n'imem ka m'sì ísì n'etiti ndi bi n'ala nka, n'etiti ndi Kenean, na n'etiti ndi-Perizait: mu onwem kwa, ebe m'nwere ndikom ole-na-ole, ha gāchikọta onwe imegidem, tigbue m, agēme kwa ka m'tọb͕ọrọ n'efu, mu onwem na ulom

31. Ha we si, Ọ̀ gēme nwa-nne-ayi nwayi dika anēme nwayi nākwa iko?

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Jenesis 34