Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jenesis 29:29-35 Bible Nso (IGBOB)

29. Leban we were Bilha, bú nwayi nējere ya ozi, nye Rechel nwa-ya nwayi, ka ọ buru nwayi nējere ya ozi.

30. Ọ we bakuru kwa Rechel, ọ we hu kwa Rechel n'anya kari Lia, we nēfè òfùfè n'aka Leban arọ asa ọzọ.

31. Jehova we hu na onye anākpọ asì ka Lia bu, Ọ we meghe àkpà-nwa-ya: ma Rechel bu nwayi-àgà.

32. Lia we turu ime, mua nwa-nwoke, kpọ aha-ya Reuben: n'ihi na ọ siri, N'ihi na Jehova elekwasiwo nweda-n'alam anya; n'ihi na ub͕u a dim gāhum n'anya.

33. Ọ turu ime ọzọ, mua nwa-nwoke; ọ we si, N'ihi na Jehova anuwo na onye anākpọ asì ka m'bu, n'ihi ya ka Ọ nye-kwa-ram nka: ọ we kpọ aha-ya Simeon.

34. Ọ turu ime ọzọ, mua-nwoke; ọ we si, Ub͕u a na mb͕e a ka dim gārapara n'arum, n'ihi na amuworom ya umu-ndikom atọ: n'ihi nka ka akpọrọ aha-ya Livai.

35. Ọ turu ime ọzọ, mua nwa-nwoke: ọ we si, Na mb͕e a ka m'gēkele Jehova: n'ihi nka ka ọ kpọrọ aha-ya Juda; ọ we kwusi imu nwa.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Jenesis 29