Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jenesis 29:17-29 Bible Nso (IGBOB)

17. Anya Lia esighi ike; ma Rechel mara nma n'aru ma kwa nma ile anya.

18. Jekob we hu Rechel n'anya; ọ si, M'gēfè gi arọ asa n'ihi Rechel, bú nwa-gi nwayi nke-ntà.

19. Leban we si, Ọ di nma ka m'nye gi ya, kari were ya nye nwoke ọzọ: nọyerem.

20. Jekob we fè òfùfè n'ihi Rechel arọ asa; ha di n'anya-ya dika ubọchi ole-na-ole, n'ihi ihu-n'anya o ji hu ya.

21. Jekob we si Leban, Nyem nwunyem, n'ihi na ubọchim nile ezuwo, ka m'we bakuru ya.

22. Leban we chikọta ndi ebe ahu nile, me oké oriri.

23. O rue, n'anyasi, na o kuru Lia nwa-ya, me ka ọ bakuru Jekob; Jekob we bakuru ya.

24. Leban we nye ya Zilpa, bú nwayi nējere ya ozi, ka ọ buru nwayi nējere Lia nwa-ya nwayi ozi.

25. O rue na, n'ututu Jekob wee hu na nwanyi ahu bu Lia: ọ we si Leban, Gini bu nka i meworom? Ọ̀ bughi n'ihi Rechel ka m'efère òfùfè n'aka gi? n'ihi gini kwa ka i ghọb͕urum?

26. Leban we si, Adighi-eme otú a n'ebe nke ayi, inye nke-ntà tutu enye nke-okenye.

27. Debezue abali asa nke nwayi a, ma ayi gēnye kwa gi nwayi a n'ihi òfùfè i gēfè kwa ọzọ n'akam arọ asa ọzọ.

28. Jekob we me otú a, debezu abali asa nke Lia: ọ we nye ya Rechel nwa-ya na nwunye.

29. Leban we were Bilha, bú nwayi nējere ya ozi, nye Rechel nwa-ya nwayi, ka ọ buru nwayi nējere ya ozi.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Jenesis 29