Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jenesis 27:35-46 Bible Nso (IGBOB)

35. Ọ si, Nwa-nne-gi biara n'aghughọ, nara ngọzi-gi.

36. Ọ si, Ọ̀ bu na akpọrọ aha-ya Jekob na o jidewom ikiri-ukwu ub͕ò abua ndia? ọnọdu-ọkparam ka ọ nara: ma, le, ub͕u a ka ọ naraworo ngọzim. Ọ si, Ọ̀ dighi ngọzi i debeworom?

37. Aisak we za, si Isọ, Le, edowom ya onye nwere ike n'aru gi, ọ bu kwa umunne-ya nile ka m'nyeworo ya ka ha buru ndi-orù-ya; ewerewokwam ọka na manya-vine ọhu me ka o guzosie ike: gini kwa ka m'gēmere gi, nwam?

38. Isọ we si nna-ya, Ọ̀ bu nání otú ngọzi ka i nwere, nnam? gọziem, ọbuná mu onwem, nnam. Isọ we welie olu-ya, kwa ákwá.

39. Aisak nna-ya we za, si ya,Le, site n'ebe di urù nke ala ka ebe-obibi-gi gādi,Site kwa n'igirigi nke elu-igwe site n'elu;

40. Ọ bu kwa mma-agha-gi ka i gēji di ndu, ọ bu kwa nwa-nne-gi ka i gēfe;O gēru kwa, mb͕e, i gālù, ulù,Na i gētijipu yoke-ya n'olu-gi.

41. Isọ we kpọ Jekob asì n'ihi ngọzi ahu nke nna-ya gọziri ya: Isọ we si n'obi-ya, Ubọchi iru-újú bayere nnam nābiaru nso; m'gēb͕u kwa Jekob nwa-nnem.

42. Ewe gosi Rebeka okwu ndia nke Isọ nwa-ya nke-okenye; o zìe, kpọ Jekob, bú nwa-ya nke-ntà, si ya, Le Isọ nwa-nne-gi nākasi onwe-ya obi bayere gi, nēzube ib͕u gi.

43. Ma ub͕u a, nwam, ge nti n'olum; bilie, b͕akuru Leban, bú nwa-nnem nwoke, rue Heran;

44. gi na ya nọ ubọchi ole-na-ole, rue mb͕e ọnuma nwa-nne-gi gālaghachi;

45. rue mb͕e iwe nwa-nne-gi gēsi n'aru gi laghachi, ọ we chezọ ihe i meworo ya: m'gēziga kwa, si n'ebe ahu kulata gi: n'ìhi gini ka m'gēji kwa b͕ara aka unu abua, bú umum, n'otù ubọchi?

46. Rebeka we si Aisak, Ike ndum agwusiwom site n'iru umu-ndinyom Het: ọ buru na Jekob luru nwunye sitere n'umu-ndinyom Het, dika ndia, bú site n'umu-ndinyom ala nka, ùrù gini ka ndu baram?

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Jenesis 27