23. Ma ọ mataghi ya, n'ihi na aka-ya abua bu aji aji, dika aka Isọ nwa-nne-ya: o we gọzie ya.
24. Ọ si, Gi onwe-gi, ì bu kwa nwam Isọ? Ọ si, Mu onwem bu ya.
25. Ọ si, Buterem ya nso, ka m'ri kwa ufọdu nime anu nwam chutara, ka nkpuru-obim we gọzie gi. O we butere ya nso, o rie: o butekwara ya manya-vine, ọ nua.
26. Aisak nna-ya we si ya, Biko, bia nso, sutum ọnu nwam.
27. Ọ bia nso, sutu ya ọnu: o we nu ísi uwe-ya, gọzie ya, si,Le, ísì nwamDi ka ísi ọhia nke Jehova gọzi-woro:
28. Ka Chineke nye gi ufọdu nime igirigi elu-igwe,Na ufọdu nime ebe di urù nke ala,Na ọka na manya-vine ọhu ri nne: