Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jenesis 27:19-29 Bible Nso (IGBOB)

19. Jekob we si nna-ya, Mu onwem bu Isọ ọkpara-gi; emewom dika i gwaram: biko, bilie, nọdu, rie ufọdu n'anu m'chutara, ka nkpuru-obi-gi we gọziem.

20. Aisak we si nwa-ya, Ì si kwa aṅa me ngwa ichọta ya, nwam? Ọ si, N'ihi na Jehova, bú Chineke-gi, mere ka o zutem.

21. Aisak we si Jekob, Biko, bia nso, ka m'we bitu gi aka, nwam, ma gi onwe-gi bu nwam Isọ ahu, ma-ọbu na i bughi ya.

22. Jekob we jekuru Aisak nna-ya nso; o bitu ya aka, si, Olu a bu olu Jekob, ma aka ndia bu aka Isọ.

23. Ma ọ mataghi ya, n'ihi na aka-ya abua bu aji aji, dika aka Isọ nwa-nne-ya: o we gọzie ya.

24. Ọ si, Gi onwe-gi, ì bu kwa nwam Isọ? Ọ si, Mu onwem bu ya.

25. Ọ si, Buterem ya nso, ka m'ri kwa ufọdu nime anu nwam chutara, ka nkpuru-obim we gọzie gi. O we butere ya nso, o rie: o butekwara ya manya-vine, ọ nua.

26. Aisak nna-ya we si ya, Biko, bia nso, sutum ọnu nwam.

27. Ọ bia nso, sutu ya ọnu: o we nu ísi uwe-ya, gọzie ya, si,Le, ísì nwamDi ka ísi ọhia nke Jehova gọzi-woro:

28. Ka Chineke nye gi ufọdu nime igirigi elu-igwe,Na ufọdu nime ebe di urù nke ala,Na ọka na manya-vine ọhu ri nne:

29. Ka ndi di iche iche fè gi,Ka mba di iche iche kpọ isi ala nye gi:Buru onye nwere ike n'aru umunne-gi,Ka umu nke nne-gi kpọ kwa isi ala nye gi:Ka onye ọ bula nke nābu gi ọnu buru onye anābu ọnu,Ka onye ọ bula nke nāgọzi gi buru kwa onye agọziri agọzi.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Jenesis 27