Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jenesis 24:26-39 Bible Nso (IGBOB)

26. Nwoke ahu we rube isi, kpọ isi ala nye Jehova,

27. si, Onye agọziri agọzi ka Jehova, bú Chineke nke onye-nwem Abraham, bu, Onye nārapughi ebere-Ya na ezi-okwu-Ya n'ebe onye-nwem nọ: mu onwem, n'uzọ ka Jehova duworom rue ulo umu-nne onye-nwem.

28. Nwa-ab͕ọghọ ahu we b͕a ọsọ, gosi ulo nne-ya dika okwu ndia si di.

29. Ma Rebeka nwere nwa-nne nwoke, nke aha-ya bu Leban: Leban we b͕akuru nwoke ahu n'èzí, rue isi-iyi ahu.

30. O rue, mb͕e ọ huru nb͕a-aka ahu, na ọla-aka abua di n'aka nwa-nne-ya nwayi, mb͕e ọ nukwara okwu nile nke Rebeka nwa-nne-ya nwayi, si, Otú a ka nwoke ahu gwaram; na o biakutere nwoke ahu; ma, le, o nēguzo n'akuku camel-ya n'akuku isi-iyi ahu.

31. O we si, Bata, gi onye agọziri agọzi nke Jehova; n'ìhi gini ka i nēguzo n'èzí? n'ihi na mu onwem edoziwo ulo, na ebe camel-i gānọ.

32. Nwoke ahu we ba n'ulo, ọ tọpu ibu camel-ya; ọ nye ya okporo-ọka na nri-anu-ulo inye camel-ya, na miri isa ukwu-ya na ukwu ndikom ndi ya na ha yikọrọ bia.

33. Ewe dọba nri n'iru ya iri: ma ọ siri, M'gaghi-eri, rue mb͕e m'gēkwuwori okwum nile. Ọ si, Kwue.

34. Ọ si, Orù Abraham ka m'bu.

35. Jehova agọziwo kwa onye-nwem nke-uku; o we di uku: O nyewo kwa ya ìgwè ewu na aturu na ìgwè ehi, na ọla-ọcha na ọla-edo, na orù-ndikom na ndinyom nēje ozi, na camel na inyinya-ibu di ọtutu.

36. Sera, bú nwunye nke onye-nwem, we muara onye-nwem nwa-nwoke mb͕e ọ ghọsiri agadi: o we nye ya ihe nile o nwere.

37. Onye-nwem we me ka m'ṅua iyi, si, I gaghi-alutara nwam nwunye sitere n'umu-ndinyom nke ndi Kenean, ndi mu onwem bi n'ala-ha:

38. kama ọ bu ulo nnam ka i gējekuru, jekuru ab͕urum, lutara nwam nwunye.

39. M'we si onye-nwem, Eleghi anya nwayi ahu agaghi-esom je.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Jenesis 24