Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jenesis 22:11-22 Bible Nso (IGBOB)

11. Ma mọ-ozi nke Jehova siri n'elu-igwe kpọ ya òkù, si, Abraham, Abraham: ọ si, Lekwam.

12. Ọ si, Esetila aka-gi tukwasi n'aru nwa-okoro ahu, eme-kwa-la ya ihe ọ bula: n'ihi na ub͕u a ka M'mara na onye nātu egwu Chineke ka i bu, n'ihi na i b͕ochighi nwa-gi nwoke, nke i nwere nání ya, iwere ya nyem.

13. Abraham we welie anya-ya abua hu, ma, le, otù ebulu n'azu ya, nke alughi-ulù nējide ya na mpi-ya: Abraham we je, were ebulu ahu, sure ya ka ọ buru àjà-nsure-ọku n'ọnọdu nwa-ya nwoke.

14. Abraham we kpọ aha ebe ahu Jehova-Jaire: dika anāsi rue taa, N'ugwu nke Jehova ka agāhu ya.

15. Mọ-ozi nke Jehova we si n'elu-igwe kpọ Abraham òkù nke ub͕ò abua,

16. si, Ejim Onwem ṅu iyi, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta, na n'ihi na i mewo ihe a, n'ihi na i b͕ochighi kwa nwa-gi nwoke, onye i nwere nání ya:

17. na n'igọzi M'gāgọzi gi, n'ime ka aba uba M'gēme kwa ka nkpuru-gi ba uba dika kpakpando nke elu-igwe, na dika ájá nke di n'usọ oké osimiri; nkpuru-gi gēnweta kwa ọnu-uzọ-ama nke ndiroya;

18. ọ bu kwa na nkpuru-gi ka mba nile nke uwa gāgọzi onwe-ha; n'ihi na i gewo nti n'olum.

19. Abraham we chigharikute umu-okorọbia-ya, ha bilie, yikọ je Bia-sheba; Abraham we biri na Bia-sheba.

20. O rue, mb͕e ihe ndia gasiri, na egosiri Abraham, si, Le, Milka, ya onwe-ya amuwo-kwa-ra nwa-nne-gi nwoke, bú Nehoa, umu-ndikom;

21. Uz, bú ọkpara-ya, na Buz, bú nwa-nne-ya, na Kemuel, bú nna Eram

22. na Kesed, na Hazo, na Pildash, na Jidlaf, na Betuel.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Jenesis 22