Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jenesis 17:5-15 Bible Nso (IGBOB)

5. Agaghi-akpọ kwa aha-gi Abram ọzọ, ma aha-gi gābu Abraham; n'ihi na nna nke ìgwè mba ka M'meworo gi.

6. M'gēme kwa ka i mua ọmùmù nke-uku nke-uku, M'gēme kwa ka i ghọ mba di iche iche, ndi-eze gēsi kwa nime gi puta.

7. M'gēme kwa ka ọb͕ub͕a-ndum guzosi ike n'etiti Mu na gi na nkpuru-gi, ndi gānọchi gi, rue ọb͕ọ-ha nile, ka ọ buru ọb͕ub͕a-ndu ebighi-ebi, na M'gāburu gi, buru kwa nkpuru-gi, ndi gānọchi gi, Chineke.

8. M'gēnye kwa gi, nye kwa nkpuru-gi gānọchi gi, ala ọnọdu-ọbìa-gi nile, bú ala Kenean nile, ka ọ buru ihe-onwunwe ebighi-ebi; M'gābu-kwa-ra ha Chineke.

9. Chineke we si Abraham, Gi onwe-gi kwa, i gēdebe ọb͕ub͕a-ndum, gi onwe-gi, na nkpuru-gi, ndi gānọchi gi, rue ọb͕ọ-ha nile.

10. Nka bu ọb͕ub͕a-ndum, nke unu gēdebe, nke di n'etiti Mu na unu na nkpuru-gi, ndi gānọchi gi; agēbì nwa-nwoke ọ bula n'etiti unu úgwù.

11. Agēbì unu úgwù n'anu-aru nke apí-unu; ọ gābu kwa ihe-iriba-ama nke ọb͕ub͕a-ndu di n'etiti Mu na unu.

12. Agēbì onye ruru ubọchi asatọ úgwù n'etiti unu, nwa-nwoke ọ bula rue ọb͕ọ-unu nile, onye amuru n'ulo, na onye eji ego b͕ata n'aka onye ala ọzọ ọ bula, nke nēsighi na nkpuru-gi puta.

13. Aghaghi ibì onye amuru n'ulo-gi, na onye eji ego-gi b͕ata, úgwù: ọb͕ub͕a-ndum gādi kwa n'anu-aru-unu ka ọ buru ọb͕ub͕a-ndu ebighi-ebi.

14. Ma nwoke anēbighi úgwù, nke anēbighi úgwù n'anu-aru nke apí-ya, agēbipu nkpuru-obi ahu n'etiti umu-nna-ya; ọ mebiwo ọb͕ub͕a-ndum.

15. Chineke we si Abraham, Serai, bú nwunye-gi, i gaghi-akpọ aha-ya Serai, n'ihi na Sera bu aha-ya.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Jenesis 17