Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jenesis 16:8-15 Bible Nso (IGBOB)

8. Ọ si, Hega, nwayi nējere Serai ozi, òle ebe i siri bia? ọ̀ bu kwa ole ebe i nēje? Ọ si, Ọ bu n'iru Serai, bú nwayi-nwem, ka m'nāb͕apu.

9. Mọ-ozi nke Jehova we si ya, Laghachikuru nwayi-nwe-gi, weda kwa onwe-gi ala n'okpuru aka-ya.

10. Mọ-ozi nke Jehova si kwa ya, M'gēme ka nkpuru-gi ba uba nke-uku, agaghi-aguta kwa ya n'ihi ọtutu ọ di.

11. Mọ-ozi nke Jehova si kwa ya, Le, gi onwe-gi di ime, i gaje imu nwa-nwoke; i gākpọ kwa aha-ya Ishmael, n'ihi na Jehova egewo nti na nweda-gi.

12. Ya onwe-ya gābu kwa madu yiri inyinya-ibu-ọhia; aka-ya gēmegide madu nile ọ bula, aka madu nile ọ bula gēmegide kwa ya; ọ bu kwa n'iru umu-nne-ya nile ka o gēbi.

13. Ọ we kpọ aha Jehova Nke nāgwa ya okwu, Gi onwe-gi bu Chineke nāhu uzọ: n'ihi na ọ siri, Ọ̀ bu kwa n'ebe a ka m'leworo azu Onye nāhum anya?

14. N'ihi nka ka akpọrọ ólùlù-miri ahu Bia-lahai-roi; le, ọ di n'etiti Kedesh na Bered.

15. Hega we muara Abram nwa-nwoke: Abram we kpọ aha nwa-ya nwoke, nke Hega muru, Ishmael.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Jenesis 16