Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jenesis 16:1-4 Bible Nso (IGBOB)

1. Ma Serai, bú nwunye Abram, amughi nwa nye ya: ma ọ nwere otù nwayi nējere ya ozi, bú onye Ijipt, onye aha-ya bu Hega.

2. Serai we si Abram, Biko, le, Jehova eb͕ochiwom imu nwa; biko, bakuru nwayi nējerem ozi; eleghi anya agēsite na ya wuliem elu dika ulo. Abram we ge nti n'olu Serai.

3. Serai, bú nwunye Abram, we were Hega, bú onye Ijipt, bú nwayi nējere ya ozi, nye Abram, bú di-ya, na nwunye, n'ọgwugwu arọ nke-iri Abram biri n'ala Kenean.

4. O we bakuru Hega, o we turu ime: o we hu na ọ turu ime, ewe leda nwayi-nwe-ya n'anya-ya.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Jenesis 16