Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jenesis 14:12-24 Bible Nso (IGBOB)

12. Ha chiri kwa Lot na àkù-ya la, bú nwa nwa-nne Abram, n'ihi na ya onwe-ya bi na Sọdọm.

13. Onye b͕apuru ab͕apu we bia gosi Abram, bú onye-Hibru: ma ya onwe-ya bi n'etiti osisi terebinth nke Mamre, bú onye-Amorait, nwa-nne Eshkol, na nwa-nne Ana; ndi ahu bu kwa ndi ha na Abram di n'ọb͕ub͕a-ndu.

14. Mb͕e Abram nuru na adọtara nwa-nne-ya n'agha, ọ chiputa ndi-ya eziri ibu agha, bú ndi amuru n'ulo-ya, ọgu iri-na-ise na iri na asatọ, ọ we nāchu ha rue Dan.

15. Ọ we kesa onwe-ya imegide ha n'abali, ya onwe-ya na ndi-orù-ya, o tib͕ue ha, chua ha rue Hoba, nke di n'aka-ekpe Damaskọs.

16. Ọ we chilata àkù nile, ọzọ kwa, Lot, bú nwa-nne-ya, na àkù-ya ka ọ chilatara, ndinyom kwa, na ndi ahu.

17. Eze Sọdọm we pua izute ya, mb͕e o siri na ntib͕u nke Kedoalaoma na ndi-eze ahu, bú ndi ya na ha yikọrọ, latasia, rue ndagwurugwu Shave (nke ahu bu Ndagwurugwu Eze).

18. Melkizedek, bú eze Selem, we buputa achicha na manya-vine: onye ahu bu kwa onye-nchu-aja diri Chineke Nke kachasi ihe nile elu.

19. Ọ we gọzie ya, si, Onye agọziri agọzi ka Abram bu site n'aka Chineke Nke kachasi ihe nile elu, bú Onye-nwe elu-igwe na uwa:

20. ọ bu kwa Onye agọziri agọzi ka Chineke Nke kachasi ihe nile elu bu, Onye raworo ndi nākpab͕u gi nye n'aka-gi. Ọ we nye ya otù uzọ n'uzọ iri nime ihe nile.

21. Eze Sọdọm we si Abram, Nyem nání nke bu madu, ma were àkù n'onwe-gi.

22. Abram we si eze Sọdọm, Eweliwom akam nye Jehova, bú Chineke Nke kachasi ihe nile elu, Onye-nwe elu-igwe na uwa,

23. na m'gaghi-ewere ihe ma-ọli nime ihe ọ bula nke i nwere, site n'ogho we rue eriri-akpukpọ-ukwu, ka i we ghara isi, Mu onwem emewo Abram ka ọ buru ọgaranya.

24. Ka ihe ọ bula ghara idirim: nání ihe nke umu-okorọbia ndia riri, na òkè nke ndikom ahu mu na ha yikọrọ je: Ana, na Eshkol, na Mamre, ka ha onwe-ha were òkè-ha.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Jenesis 14