Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ilu 8:32-35 Bible Nso (IGBOB)

32. Ma ub͕u a, umum, genum nti:N'ihi na ndi ihe nāgara nke-ọma ka ndi nēdebe uzọm nile bu.

33. Nurunu idọ-aka-na-nti, we mara ihe,Unu eze-kwa-la ya ndu.

34. Onye ihe nāgara nke-ọma ka madu nke nēgem nti bu,N'imu anya n'akuku ibo-ọnu-uzọm nile kwa-ubọchi,Niche nche n'akuku-ọnu-uzọ nke ọnu-uzọm nile.

35. N'ihi na onye nāchọtam achọtawo ndu,Ọ gēnweputa kwa n'aka Jehova na ihe-ya gātọ Ya utọ.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ilu 8